N’IME Ọdịnanị Igbo, anyi nwere usoro onye odinani si agọ mmụọ. Chetakwa na ịgọ mmụọ bụ ị kpọku mmụọ di Icheiche dịka Chukwu okike, Ani, Chi na Ndịmbụ na Ndịegede. Mgbe ọbụla mmadụ kpọkuru mmụọ, onye ahụ a gọọla mmụọ.
ikwọ aka ụtụtụ
Nwoke Ọdịnanị teta ụra na ụtụtụ, o buru ụzọ kwụọ aka ya, sachaa ihu ya, ma saa ọnụ tupu ọ malite ị gọ mmụọ.
Mgbe ọ na akwọ aka ụtụtụ, ọ ga na e kwubi okwu n’isi ezi n’ụlọ ya, Ọ ga adị na-ekwu sị , na ya na-akwọchapụ ihe ọjọọ nine mere n’ime abanị mgbe ya nọ n’ụra, Ihe ọjọọ dịka, ụchụ na ọgbanukè.
Ọ kwọchaa aka ụtụtụ, o buru oche ya nọdụ-ana, were kpọkuo mmụọ na emere ya ihe ka ha bia gere ihe ọ chọrọ i kwu.
Ịgọ mmụọ
Mgbe ọ na akpọku mmụọ ndị ahụ, ọ ga e jiriri ihe n’aka, maka na anaghị agba aka akpọ mmụọ ihu. Ọ ga e ji otu n’ime ihe ndịa: ọjị, edò, mmanya, nzu, ose, maobụ mmiri.
Ọbụrụ na ọ ọjị ka o ji, o buru ụzọ kpọọ Chukwu kere ụwa, kpọọ Chi ya, kpọọ Ndimbụ na ndị egede, sị ha bịa taa ọjị. Ọ ga a kpọ Eke, Orie, Afọ, Nkwọ sị ha bịa soro taa ọjị.
Cheta na mgbe ọbụla ị kwacharà akpịrị were kpọọ mmụọ ndị a, ha nine ga agbakọ ka ha nụ ihe ị chọrọ i kwu ma kerekwa okè n’ime ihe i ji n’aka.
Ngwa, o ruona na omume, mgbe ị gọchaala mmụọ, ị ga amalite ị gọ ọfọ.
Ị gọ ọfọ
Bido Kwube ihe nine i bu n’obi, Kwube ihe ndị ị chọrọ na ndụ gị. Jụkwá ihe ndị ị na achọghị na ndụ gị ma jụsie ha ike.
Mgbe ị ji ọjị n’ekwubi okwu, mara na ọọ ọfọ ka i na agọ. Burukwa n’uche na onye ọbụla nke na a gọ ọfọ, ga e jikwa OGÙ. Ihe nkea pụtara bụ na mgbe ị na asị ka ihe dịrị gị mma, gbakwaa mbọ ka ị fụ na ị naghị e gbochi ọdịmma onye ọzọ. Igbo kpọrọ ya “i Jide Ogu na Ọfọ”.
Mgbe i gọchara ọfọ, waá ọjị, tụpụrụ ndị mmụọ otu ibé, maobụ ibé ọjị abụọ. Were otu ibe ọjị nke gị taá.
Ozugbo ị mechara nkea n’Obi dịọcha, Ndịmmụọ nine ahụ gbakọrọ ga apụ ọrụ na-egbughị oge ị fụ na ọfọ ahụ ị gọrọ bịara na mmezu. Ndị nke ga egbochi ọdachi ga amalite haziwe ọnọdụ ka ị ghara ị daba n’ihe mberede ọbụla. Mmụọ ndị nke ga anatara gị ọganihu ga akwara ngwa ọrụ ha malite ọrụ ozugbo maka na e kere ọrụ e kè. Mana buru n’uche na ọọ kwa sọọsọ ihe i kwuru n’ọnụ gị ka ha ga e me.
Izu ọzọ anyị ga akọwa ihe e ji ife ndia e me: ọjị, edò, nzu, mmanya … diri gawa. Cheta na Nkụ Dị Na Mba na Eghere Mba Nri.
Ọdịnanị Igbo amaka, Ọdịnanị Igbo dị irè.
Budike Ụgbaja (Ozioma Odinani) bụ onye isi otu Ozioma Odinani Movement, ma bụrụkwa onye hiwere otu Save Our Indigenous Languages (SOIL). Ọ na achịkọta mmemme OZIOMA ODINANI na ABS 88.5 ụbọchị Satọde ọbụla 1-2.