NA nkwadobe ya maka ịchịkọbà ntụliaka ghe anya oghe na nhọpụta ahụ a ga-eme ụbọchị Satọdee, ụlọ ọrụ ahụ na-ahụ maka nchịkọba nhọpụta ọchịchị n’ala Nigeria, bụ ‘Independent Electoral Commission’ (INEC), ngalaba ya nke steeti Anambra ekesaala ma busàsịa ihe dị iche iche a ga-eji wee tụọ ya bụ akwụkwọ.
Ya bụ nkesà akụrụngwa na ihe ndị ọzọ bụ nke weere ọnọdụ ụbọchị Wednesday n’ụlọ ọba ego ala anyị dị n’Awka, bụ isi obodo steeti ahụ, ebe e siri wee busaa ha n’okpuru ọchịchị niile e nwere na ya bụ steeti.
N’ajụjụ ọnụ ndị nta akụkọ gbàrà ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọ INEC na steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkwachukwu Ọrjị mere ka a mara na ihe e ji ekesà ma na-ebusa ya n’oge bụ ka e wee hụ na ya bụ akụrụngwa na ihe ndị ahụ niile ruchara ebe a ga-eji ha wee rụọ ọrụ n’oge ma zùkwa òkè, n’ihi na a ga-anọkwa ebe ahụ e bùgara ha wee wepùta ogè nyòchagharị ha niile ọzọ, iji hụ na o nweghị nke ọbụla na-eri mperi, ma ọ bụ na-enwe nsògbu tupu ụbọchị ahụ a ga-eme nhọpụta.
Ọ sị na ọ bụ ụbọchị Satọdee ahụ a ga-eme nhọpụta maka ndị ụlọ ọgbakọ omebe iwu ka a ga-emegharịkwa nhọpụta ahụ e kwuru na a ga-emegharị n’ọgbọ nta nkwàdo Agụata na ‘Idemili South’ bụ ebe e nwere ụfọdụ ihe iche aka mgba na ihe ọdachi ndị ọzọ n’ụbọchị mbụ ahụ e mere ya bụ nhọpụta ìzùgbe. O kwupùtazịkwara ezi njikere nke ụlọ ọrụ ahụ dị ugbu a ịchịkọba nhọpụta ọchịchị ga-aga siriri werere na bụ steeti ahụ, n’ihi na ha akwadola ma tinyesie ihe niile ha kwesiri itinye n’ọrụ màkà ya bụ nhọpụta.
Ọ kpọkuzịkwara ọhanaeze na-atụ akwụkwọ, ndị ọrụ otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị dị iche iche na-egwu okwe ndọrọ ndọrọ ka onye ọbụla kpachara anya ya, kwanyere onwe ya ùgwù ma mee ihe n’usòrò iwu, iji hụ na e nweghị ụdị nsogbu obụla ga-adapụta ọzọ na mpaghara ebe ọbụla na steeti ahụ, n’ihi na onye ọbụla a ga-enweta n’isukanye ọgba aghara n’ụdị ọbụla ụbọchị ahụ ga-eji anya ya abụọ wee hụ ntị ya na-ejighị ènyò.