NDỊ otu Kristi na mba ụwa niile mere mmemme igbu ntụ ụnyahụ.Ụbọchị igbu ntụ ‘ASH Wednesday’ bụ ụbọchị ndị otu Kristi ji amalite emume Lentị. Ọ bụ ụbochị a na-egbu ntụ n’egedege iru iji malite ebumọnụ na ekpere.
Oge Lentị bụ oge nchịkọta onwe, oge iche echiche banyere ndụ na ịrịọ mgbahara njọ. Ọ bụkwa oge ime opipia maka njọ. Ọ bụ oge a ka e ji akwado maka mbilite n’ọnwụ Jeso Kristi.
N’oge emume a, a na-eji aja maasi e bido ya. Ọ bụ n’ime ya ka a na-egbu ndị mmadụ ntụ iji gosi na mmadụ bụ ntụ, na ọ ga-alaghachịkwa na ntụ.
Ọ bụ oge a ka e ji akụziri mmadụ mkpa ọ dị igosipụta ihunanya n’ebe mmadụ nọ.
Oge Lentị na-egosipụta abalị iri anọ Jeso Kristi buru ọnụ n’ikpa.