September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

E jidela mmadụ iri atọ na ise n’Anambra maka ọgwụ ike

SITE na njikọaka ọnụ nke ụlọ ọrụ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide ọgwụ ike n’ala Nigeria, bụ ‘National Drug Law Enforcement Agency’ (NDLEA), ndị ọrụ agha ala anyị, ndị uwe ojii, ndị ọrụ ụlọ mkpọrọ, ndị ụlọ ọrụ na-ahụ maka mbàtá na ọpụpụ n’ala anyị, bụ ‘Nigerian Immigration Service’ na ndị ndị ọrụ nchekwa mmadụ nkịtị, bụ ‘Nigeria Security and Civil Defence Corps’ a nwụchikọọla mmadụ iri atọ na ise a na-enyo ènyò na ha na-etinye aka n’ihe metụtara ọgwụ ike.

Ndị a bụ ndị e jidere site na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ, nke gụnyere Nnewi, Ọkịja, Obosi, ọdụ ụgbọala Ihiala, nke Aba, nke Owerri, nke Lagos, nke Benin. Ihe ndị e nwekọtakwara n’aka ha gụnyere ọgwụ Cannabis sativa, ọgwụ Cocaine na ọgwụ ike Heroine.

N’okwu ya bànyere nke ahụ, onyeisi ụlọ ọrụ NDLEA na steeti ahụ, bụ maazị Sule Momodu mere ka a mara mbọ pụrụ iche ha na-agba iji busoo ịkpọ, ịñụ ma ọ bụ ịtụ mgbere ọgwụ ike agha na ya bụ steeti ahụ, ma kwuo na nke ahụ na-aga n’ihu n’ịmịta ezi mkpụrụ a tụrụ anya, ọ kachasị ugbu a ụlọ ọrụ ahụ na ụlọ ọrụ nchekwa ndị ọzọ màlitere ijikọ aka ọnụ na ya bụ agha.

O mere ka a mara na ụlọ ọrụ niile ahụ ga-aga n’ihu na njikọ aka ahụ, ma na-ebukwa agha na mgbe na mgbe megide ndị niile na-etinye anya n’ọgwụ ike, wee ruo mgbe ịtụ mgbere ọgwụ ike ga-aghọ akụkọ mgbe ochie na steeti ahụ.

Dịka ọ na-etò aka na-achị steeti ahụ bụ gọvanọ Willie Obianọ maka ezi nkwàdo ọ na-enye ha, maazị Momodu kpọkùrù ndị na-etinye aka n’ọgwụ ike na steeti ahụ ka ha sepù aka na nke ahụ ma ọ bụ kwara ngwongwo ha pụọ na ya bụ steeti n’ihi na o nweghịzịkwa ebe mgbaba ọbụla dịịrị ha. Ọ dụzịkwara ndị nne na nna ka ha na-ejide ma na-eleru ụmụ ha anya nke ọma oge niile, iji mara ebe ha na-etinye aka na ndị ha na ha na-emekọ ihe.

O mere ka a mara na ndị ahụ a nwụchikọrọ bụ ndị a ga-enyòcha nke ọma ma tọhàpụ ndị aka ha dị ọcha n’ime ha, ebe ndị ikpe mara bụ ndị a ga-akpụpụ ụlọ ime ma were iwu mee ha ihe.

%d bloggers like this: