IHE mberede nke okporo ụzọ dapụtara n’Umuchu nke dị n’okpuru ọchịchị Aguata na steeti Anambra ụbọchị Tuzudee ọnwa a dị n’abalị iri na abụọ.
Nke a kpọtụrụ n’Afọ Ibughubu Umuchu nke dị n’okporo ụzọ si Igboukwu gaa Umunze.
Ndị ọ nọ ka o mere kọwara na ọ bụ otu nnukwu ụgbọala (trailer) nke na-ekweghị onye na-akwọ ya kwusi tikapuru ọsọ wee mabanye n’ahia wee mebie ndụ na ụlọ ahia. He kọwara na ka nke ahụ na-eme nnukwu ụgbọala ahụ kụtukwara ugbọala tipa nke mere ka ihe mebie karia. Ndị mmadụ tụfuru ndụ ha ebe ụfọdụ merụrụ ahụ, ebe ụlọ ahịa na akụ na ụba ndị mmadu lara n’iyi. Otu o sila dị, ndị o metutara n’obi gbatara ọsọ enyemaka.
Otu o sila dị, site n’ozi nke a gbasara n’ikuku, John Obijeme kọwara na onye a họputara ịnọchite anya ndị ogbo nta vootu Aguata I n’ụlọnzukọ omebe iwu steeti ahụ (Anambra State House of Assembly member elect Aguata I Constituency) nwa afọ Umuchu bụ Hon Cater Dike Nnamdi Umeh onye nke ji otu ‘All Progressive Grand Alliance’ (APGA) wee zọọ ọchichị bịara na ya bụ ebe ebelebe gburu wee hụ ka o si mee. O tiiri ndi nke ahụ metụtara aka n’obi ma gaa n’ụlọgwụ kwụọrọ ndị melụlụ ahụ ụgwọ.
N’okwu nke ya, Ben Mbachu kwuru na ndi otu a kpọrọ ‘PDP Ambassadors in Aguata’ gbatakwara ọsọ iji tiere ndi Ibughubu Umuchu bụ ndị ihe mberede ahụ mere be ha aka n’obi. Ha kwere nkwa ịgba mbọ hụ na e gbochiri ihe mberede nke na-emekarị n’okporo ụzọ ahụ. Ha gakwara n’ụlọọgwụ ebe ndị merụrụ ahụ nọ ma leta ha.
Ndị Umuchu nile ji ohere a wee na-ekele aka na-achị steeti Anambra bụ Willie Obiano (Akpokuedike Global) n’ihi afọ ọma nke o gosiri ha afọ olemole gara aga nnukwu ihe mberede mere n’ahịa ahụ ma gbuo ihe kariri mmadụ iri ma merukwaa imirikiti mmadụ ahụ. Gọvanọ kwụrụ ụgwọ ụlọọgwụ ndị nile meruru ahụ ma kwụkwaa ụgwọ maka ndị nwụrụ anwụ.
Ha na-asi ya daalu maka na e too dike na nke o mere eme o mekwaa ọzọ. Ha na-agoro ya ọfọ ndụ ndụ nka nka ma na-arịọzị gọọmentị steeti Anambra ka o biko gbatara ha ọsọ enyemaka maka ihe mberede na-emekari n’ahịa ahụ bụ Afọ Ibughubu Umuchu. Ha na-akpoku gọọmentị ka o tinyere ha ihe mgbochi (speed breaker) nke a na-etinye n’okporo ụzọ iji belata oke waa waa waa ndị ọkwọ ụgbọala.