September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Nigeria ahọpụtala ndị gọvanọ na ndị omebe iwu ọhụrụ

A woman casts her vote during gubernatorial election in Uyo, Nigeria, Tuesday, April 26, 2011. Nigeria began voting Tuesday for who should serve as state governors in the oil-rich nation, lucrative positions which many politicians use violence and election fraud to obtain. (AP Photo/Sunday Alamba)

DỊKA a chịkọtara nhọpụta ọchịchị nke ahọ 2019 n’ala bịara n’isi njedobe, a họpụtala ndị gọvanọ ọhụụ na ndị omebe iwu ọhụụ na steeti dị iche iche.

Nhọpụta a bụ nke weere ọnọdụ n’abalị iteghete nke ọnwa Maachị ahọ a, ma bụrụkwa nke e mere n’ọtụtụ steeti dị iche iche ụbọchị ahụ. Tupu ya bụ oke ụbọchị, akụkọ dị iche iche malitere kọba n’ebe dị iche iche banyere ihe aghaghị ime na ihe agahị eme na ya bụ ntụliaka, nke mezịrị ka ọtụtụ steeti nọrọ n’oke egwù ma chịrịkwa uche n’aka.

Dịka akụkọ e nwetara site n’ọtụtụ ebe siri kọọ, nhọpụta ahụ bụ nnọọ nke gara n’ụfọdụ ebe dịka ndị mmadụ siri chee, ma gakwa n’ụfọdụ ebe ndị ọzọ n’ụzọ abụghị ka e siri chee ma ọ bụ tụọ anya. E wezùga steeti Anambra, Ondo, Ekiti, Osun na Edo, bụ ebe e mere naanị nhọpụta ndị ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti; e mere nhọpụta ọkwa gọvanọ ndị ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti na steeti iri atọ na otu ndị ọzọ dị n’ala anyị, bụkwa nke otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche nwetara mmeri na ha.

N’ụfọdụ steeti n’ala anyị, dịka steeti Rivers, Delta, Kastina, Kaduna Ebonyi, Ondo, Oyo na ụfọdụ ebe ndị ọzọ, e nwegasịrị ọtụtụ ihe iche aka mgba, ịkwafù ọbara na ihe ọdachị ndị ọzọ, bụ nke biri nhọpụta ahụ aka ọjọọ na mparagha ebe ahụ. O pekata mpe, mmadụ iri na ise ka e gburu egbu na steeti ndị ahụ, ebe ngwo-ngwo na akụnụba gburu nde kwùrú nde Naịra bụ nke e bibìrì ebibi na ya bụ nhọpụta n’ọtụtụ ebe na steeti dị iche iche.

Otu ọ dị, ntụliaka ahụ bụ nke gara nkè ọma ma gakwa siriri wèrèrè na steeti Anambra karịa ka a tụrụ anya, na-agbanyeghị na e nwekwara ụfọdụ ihe ọdachi dapụtara n’ụfọdụ ime obodo. Dịka ụlọ ọrụ ahụ nchịkọba ọkwa ọchịchị dị n’aka n’ala anyị bụ ‘Independent National Electoral Commission’ (INEC) sìrì kwe na nkwà tupuu ụbọchị ntụliaka; ntụliaka bidoro nnọọ n’elekere asatọ kpọnkwem n’ọtụtụ ebe dị iche iche na steeti Anambra ahụ, nke gụnyere: Ebenator, Ọsụmenyi, Ụkpọr na Ụtụh (dịgbàdò n’okpuru ọchịchị Nnewi South na steeti ahụ). Otu ọ dị, ịtụ akwụkwọ ebidochaghị n’oge n’ụfọdụ ebe, n’ihi abịaghị n’oge, ngharịpụ nke akụrụnwga e ji enyocha akwụkwọ ikike e ji atụ akwụkwọ, bụ ‘Smart Card Reader’, na ihe ndị ọzọ (dịka a hụtarana Nnọkwa dị n’okpuru ọchịchị Idemili South na ụfọdụ ebe ndị ọzọ).

N’ihe gbasaara nsonye ndị mmadụ na ya bụ ntụliaka, ọ bụ ihe doro anya, dịka a chọpụtara n’ọtụtụ ebe dị iche iche, na e nwechaghịzị ọtụtụ ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ sonyere na nke a dịka e nwere n’oge e mere ntụliaka maka ọkwa onyeisi na ndị ụlọ ọgbakọ omebe iwu etiti, dịka ọtụtụ ndị gbakụtara nke ahụ azụ ma jewara ahịa, ọrụ, igwù mmiri, igwu egwe nakwa ihe ndị ọzọ dị ha mkpa ụbọchị ahụ.

Oge ndị nta akụkọ ‘National Light’ rutere ofiisi ndị INEC dị n’Awka South, a hụtakwara na ọdịghị ngwongwo ọbụla nke e ji eje ọlụ INEC dịzị ebe ahụ nke pụtara na ebupụchago ngwongwo eji arụ ọlụ INEC n’ebe kwesịrị ka ewere ha ruo ọlụ.

N’otu aka ahụ ndị e were ka ha nye aka ‘Adhoc’ juputara ụlọọlụ INEC  n’oge gara aga bụzi akụkọ mgbe ochie, onweghị ndị nọzị ebe ahụ. Ndị ọbụla a gachaala ebe onodo ọlụ ha dị.

Otu onye na ndị ụlọọlụ kọwara na onye ọbụla gachara ebe ha ga-anọ ruo ọlụ ha.

Mgbe ndị nta akụkọ ‘National Light’ gara n’Eke ‘Market Square 4’ nke dị n’Amawbia, ha hụrụ ka ọlụ sị a ga. Ha kwuru na ọdịghị nsogbu mọbụ ọgbaaghara dị n’etiti ha.

Chinwoke Nweke onye nke tugoro akwụkwọ vootu nke ya kwuru na ndị ọlụ INEC bịakwara n’oge ma bido ọlụ ha dịka o kwesịrị. Ha gakwara na ‘Community Primary School 2’ Amawbia leta ka ọlu sị a ga.

N’ajụjụ ọnụ nke ndị nta akụkọ a gbara onye isi ọlụ oyibo n’Anambra bụ Harry Udu (Head of Service), o kwuru na ndị ọlụ INEC bidoro n’oge ma malite dịka o kwesiri kama na ya ahụghị ọtụtụ mmadụ dịka ọtubala anya. O kwukwara mkpa ọ dị ịgwa ndị mmadụ gbasara ibinye aka maka nhọpụta ọchịchị.

N’Nkwo Mimi ‘Square’ Nawfia, onye ọlụ ‘presiding officer’ kwuru na ha bịara n’oge.

N’ajụjụ ọnụ ndị nta akụkọ gbara ha bànyere nke ahụ, ụfọdụ n’ime ụmụnwaanyị a hụrụ n’ahịa Eke Ọsụmenyi dị na Nnewi South (mgbe ntụliaka na-aga n’ihu), ebe ha na-akwọrọ onwe ha akamụ ma na-ayọchasị nri ọka ha na-ere ere n’ahịa ahụ ụbọchị ahụ, nke gụnyere: oriakụ Fidelia Afọma, oriakụ Uju Mmadụbụọgụ na oriakụ Agnes Ụgbọaja kwuru na o nweghị ihe gbasaara ha na ịtụ akwụkwọ n’ihi na ndị niile na-egwu okwe ndọrọndọrọ ọchịchị bụ ndị wàyo, bụ ndị (dịka ha siri kwuo) ọ na-abụ maadụ tụnyechaara akwụkwọ, ha echezọọ onye ahụ n’ime ahụhụ ya ma na-eri ego gọọmenti naanị ha.

N’akụkọ dịkwa ka ibè ya, n’ajụjụ ọnụ a gbara ha maazị Romanus Obika na Ezeh Amaefuna, bụ ụfọdụ ụmụnwoke a hụrụ n’ọdụ ahịa Nkwọ Akwaihedị ebe ha nọ na-azụ òkwè, na-añụrụ onwe ha mmanya ma na-akọrị akụkọ (dịka ntụliaka na-aga n’ihu); ha kwuru na ndị ọnụ na-eru n’okwu edechaalarị mpụtara ntụliaka ahụ ma debe ya edebe na-echezị ka e mechaa ntụliaka.

Ha kwuru na nke ahụ pụtara ìhè na nhọpụta izugbe onyeisi ala ha sònyere na ya, bụ nke ha sị na ọ bụghị onye kwesiri ituru ùgò tuuru ùgò na ya, ma kwèrezie n’ihi ya kwuo na onye ga-eturu ùgò na nhọpụta nke ụbọchị ahụ ga-eturu ùgò, ebe onye ga-ada ada ga-adara onwe ya, ma ha ọtụrụ akwụkwọ ma ha atụghị, n’ihi na ịtụ akwụkwọ ha enweghị mgbanwe ọ ga-eweta na mpụtara nhọpụta ọchịchị ahụ.

N’ihe gbasaara ọdachi, e nwere ụfọdụ ihe iche aka mgba, nsògbu na ọgbagara dapụtara n’ụfọdụ ebe, nke gụnyere Akwaihedị, ebe a sụkasịrị ụfọdụ mmadụ mmà ma merụọkwa ụfọdụ ahụ ebe ha gara ịtụ akwụkwọ; na Obosi dị n’Idemili North, bụ ebe e gbùrù mmadụ abụọ ma merụọkwa ọtụtụ ahụ ụbọchị ahụ, tinyere ụfọdụ ebe ndị ọzọ.

N’ebe o metụtara mpụtara atụmakwụkwọ ahụ na ya bụ steeti, otu ndọrọndọrọ niile sonyere na asọmpi ahụ lụrụ nnọọ ọgụ ahụ dịka nwoke, ma otu ndọrọndọrọ All Progressive Grand Alliance (APGA) gosiri ihe o jiri bụrụ ọka ibè site n’ịzachakọ na inweta mmeri n’ọgbọ nta nkwàdo iri abụọ na anọ n’ime ọgbọ nta nkwàdo iri atọ e nwere na ya bụ steeti, ebe otu ndọrọ ndọrọ People’s Democratic Party (PDP) werezịrị isii fọrọ afọ.

Ọgbọ nta nkwàdo niile ahụ na otu e siri nweta mmeri na ha gụnyere:

Anaocha I PDP

Anaocha II APGA

Awka North APGA

Awka South I APGA

Awka South II APGA

Dunukofia APGA

Idemmili North APGA

Idemmili South APGA

Njikoka I APGA

Njikoka II APGA

Anambra West APGA

Anambra East APGA

Oyi APGA

Onitsha NORTH I PDP

Onitsha NORTH II APGA

Onitsha South I APGA

Onitsha South II APGA

Ogbaru I PDP

Ogbaru II PDP

Ayamelum APGA

Aguata I APGA

Aguata II APGA

Ihiala I APGA

Ihiala II APGA

Ekwusigo PDP

Nnewi North APGA

Nnewi South I APGA

Nnewi South II PDP

Orumba North APGA

Orumba South APGA.

 

%d bloggers like this: