TAA ka Gọvanọ Obiano ga-eme afọ ise ọ malitere chịba steeti Anambra ma bụrụkwa afọ nke mbụ n’ọchịchị ya nke ugboro abụọ.
A ga-ejikwa ohere ahụ wee kelee Chineke maka inye aka ya, nchekwa ya, ezi ọganiru na udo nke dị na steeti Anambra kemgbe ọ malitere ọchịchị ya.
Akwụkwọ nsọ kwuru na ọ bụ site na mkpụrụ ha ka a ga-eji mara ha. Ịwetue anya ala, ị ga-ahụ mkpụrụ ọma nke nwaamadi a na-amipụta kemgbe afọ ise ọ nọgoro n’ọkwa ọchịchị nke obodo a. Ọ na-eweba aka na mmepe ime obodo nile site n’amụma nke a kpọrọ ‘Obodo ọbụla họrọ ihe ha ga-alụ’ (Community Choose Your Project Initiative). O nyere ha akatamkpo ego maka ịlụ ọlụ ọbụla ha họọrọ. Obodo nile dị n’Anambra natachara ego ahụ, ọlụ ndị a pụtakwara ihe ebe nile.
Ọ na-alụkwa ọtụtụ ọlụ ndị ọzọ dị iche iche. Ụlọọlụ Anambra Newspapers and Printing Corporation sokwa wee rite erele n’ọchịchị Gọvanọ Obiano, ọ na-akwụ ụgwọ mgbe nile. Ọtụtụ afọ gara aga, anaghị akwụ ndị ọlụ lagoro ezumike nka ụgwọ n’ụlọọlụ ahụ, ma ugbu a, a na-akwuzi ha ụgwọ dịka o kwesiri. Ọ bụghị nani nke a, ịbata n’ogige ụlọọlụ National Light, ị ga-ahụkwa ọtụtụ ihe mgbanwe dị na ya.
Gọvanọ Willie Obiano na-eme ihe dịka o si kwu, ọ dịghị ka ọtụtụ ndị ọchịchị ndị ọzọ na-abụ ha na-ekwu ọzọ, ha a na-eme ọzọ. O sonyere n’ọchịchị onye ọ nọchitere anya ya nke mere ka agha a malitere ị bụ megide ndị ntọrị kwusịrị n’egbughị oge.
N’ihe banyere nchekwa, Anambra bụ ebe ndị ọzọ na-abata ezuru ike. I buru akpa gị bata, ị ga-ebukwa ya wee laa n’udo. N’akụkụ agụmakwụkwọ, nka na ụzụ, ahụike w.d.g, ị ga ahụkwa aka ọlụ ya. Ezi echiche ya na-apụtakwa ihe n’ebe ndị ntorobịa nọ dịka o wepụtara amụma ọlụ a kpọrọ ‘Otu ntorobịa otu ọlụ’ (One Youth One Skill). Otu ntorobịa otu ọlụ a ga-eme ka enweghị ọlụ beleta n’Anambra. Ọ ga-emekwa ka otu nzuzo belatakwa n’ihi na ụmụ ntorobịa nwee ọlụ, uche ha apụọ n’ihe ọjọọ.
O kwesiri ka mmadụ nile pụta ma kwado Gọvanọ Willie Maduaburochukwu Obiano n’idozi obodo anyị bụ Anambra makana a nyụkọọ amiri ọnụ, ọ gbọọ ụfụfụ.