Ọrụugbo n’gba ọfụụ

0
515

ỌLỤGBO so n’otu ihe e ji mara ndị Igbo. Ọ bụ site n’ọlugbo ka e si enweta ihe oriri dị iche iche maka na ọ bụ aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ. E sikwa na ya enweta ego. Ọlụgbo gunyere: ihe ndị a na-akọ n’ubi na ikpa anụmanụ.

A bịa n’ihe a na-akọ n’ubi, ọ bụ ji kacha ha nile dị mkpa n’ala Igbo. Ọ bụ nke a mere na nwoke ọbụla na-akọpụta ji nke ukwu na-enwe ugwu na nsọpụrụ dị egwu. Ọ bụkwa ya mere na e ji ji aza aha dị iche iche dịka Diji, Ezeji, Jibuaku w.d.g.

N’oge gboo, nwoke lụrụ ọtụtụ nwaanyị na-alụ ọlụgbo nkeọma n’ihi na o nwere ụbara mmadụ. Ụbara nwaanyị na-ebute ụbara mmadụ nke a na-eme ka ha na-alụpụta ọlụ n’ike n’ike. N’oge ahụ chi fo n’ụtụtụ ha agaba n’ugbo maka ịlụ ọlụ, ha jikwara ọlụgbo kpọrọ ihe nke ukwu. Ka ha na-akọ ugbo ka ha na-azụ anụmanụ dị iche iche dịka ehi, atụrụ, ewu, ọkụkọ w.d.g. Ha sikwa n’anụmanụ na-enweta ihe oriri na ego.

N’oge ugbu a, ndị Igbo ka na-akọkwa ọlụ n’ike n’ike makana ọkụkọ hapụ kwọm gịnị ka ọ ga-eji zụọ ụmụ ya? Ha na-akọ ugbo ma na-azụkwa anụmanụ. Mana ihe dị iche bụ na n’oge ugbu a gọọmentị na-enyere ha aka site n’ịgbazinye ha ego ma bunyekwa ha ntụ (fertilizer) e ji akọ ọlụ ma nọdụkwa n’elu ya na-enye ha nkuzi ma na-agbazikwara ha. Ọ bụ n’ihi nke a ka ọlụgbo ji agazi were were. E nwezikwara akọrọngwa dị iche iche nke na-enye aka n’ọlụgbo n’ụdị ọgbara ọhụrụ ya.

E nwechara ma nke a na-anya anya dịka ụgbọala (tractor) e ji akọ ihe. Nke ahụ na-akọpụta ọtụtụ obosara ala n’otu ụbọchị.

Gọọmentị steeti Anambra nke Gọvanọ Obiano nọ n’isi ya na-agba mbọ dị iche iche site n’ịkwado ndị ọlugbo. Ọ na-ebunye ha ihe ga na-enyere ha aka ma na-enyekwa ha ego.

Ọ bụ ihe ndị a mere dịka udummiri na-akpudebe nso, ndị ọlụgbo na-amalite nwayọọ nwayọọ n’ihi na agha a kara aka anaghị eri nwa ngwọrọ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here