September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Anambra amachiela ịzụ ahịa n’okporo ụzọ

AKA na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ enyela ntụziaka ka a màchie ihe ọbụla bụ ịzụ ma ọ bụ ire ahịa n’okporo ụzọ n’ụdị ọbụla na mpaghara ebe ọbụla steeti ahụ ozigbo ozigbo, dịka ọ dị n’akwụkwọ iwu megidere nke ahụ.

Gọvanọ Obianọ nyere ntuziaka ahụ n’ụlọ ahụike Toronto dị n’Ọnịtsha oge ọ gara ileta ndị ahụ nwetara mmerụ ahụ n’ihe mberede ahụ mere na mpaghara Upper-Iweka oge otu nnukwu ụgbọala bu mmanụ ọkụ jìrì ọsọ wee sukanye isi n’ebe ndị mmadụ na-azụ ma na-ere ahịa n’okporo ụzọ nọ, wee gwetaa mmadụ iri ma merụọkwa mmadụ asaa ndị ọzọ àhụ.

Ọ kọwara ịzụ ahịa n’okporo ụzọ dịka nke jọgburu onwe ya n’ihi na ndị na-eme nke ahụ na-anọkarị n’ajọ ọnọdụ ihe egwu, ihe ike na ihe mberede ndị ọzọ, ọ kachasị mgbe e nwere ihe ọdachi ọbụla n’okporo ụzọ ahụ. Ọ kpọkùrù ndị Anambra ka ha sepu aka na nke ahụ ozigbo ozigbo iji chekwaba ndụ ha, ma kpọkukwa ha ka ha na-echekwaba ndụ, ahụike ngwa ahịa na ihe ndị ọzọ ha nwere site n’ịga debànye ha n’aka ụlọ ọrụ ahụ na-ahụ maka nchekwaba pụọ n’ihe mberede, bụ Insurance Scheme.

O kwekwazịrị nkwà na ọchịchị steeti ahụ ga-elebà anya nke ọma ma mee nnyocha zuru òkè iji wee chọpụta ihe butere ya bụ ihe mberede okporo ụzọ, ma were usoro kwesiri ekwesi gbasòó ya.

 

%d bloggers like this: