GỌỌMENTI mba China ekwuputala ma gosipụta njikere ya ịkwalite ezi mmekọrịta ahụ dị n’etiti ya na steeti Anambra n’ihe gbasaara nkwàlite mmepe obodo, na azụmahịa.
Onye nnọchite anya mba ahụ n’ala Nigeria, bụ Maazị Zou Pingjian kwupùtara njikere a oge ya na ndị otu ya sitere China bịara kpọtụrụ aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ n’ebe obibi gọvanọ dị n’Amawbịa. O mere ka a mara na mbà ahụ ebinyela aka n’akwụkwọ iwu bànyere iwunye ihe mwunye na mba òfèsi, ma kwuo na ebumnobi o jiri bịa bụ iji wee chọọ ụzọ ha ga-esi wunyekwuo ihe mwunye n’ọtụtụ ohere ọma ahụ jupùtara na ya bụ steeti, ọ bụnadị ka o kwuru na o nwere ọtụtụ ihe jikọrọ ha na steeti Anambra.
Ọ sị na e wezùga ihe gbasaara azụmahịa, na e nwèrè ihe ndị ọzọ ha chọrọ ka ha na steeti Anambra na-emekọ, ọ kachasị dịka o siri metụta omenala na ịkwàlite njem nlegharị anya.
N’akụkụ nke ya, aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ, onye nabàtara ha bụ ndị ọbịa kwuputara njìkere steeti ahụ ịga n’ihu na ya bụ njikọaka na mmekọrịta. O kwuru na gọọmenti steeti ahụ amalitelarị ọrụ ebe ụgbọala ga na-ada n’ọdụ ụgbọelu ahụ a na-arụ n’Ụmụeri.
Ọ rịọrọ ha ka ha rụọ ụlọ ọrụ ha n’Awka, ebe ọ bụ na e nwere ọtụtụ ndị na-esi mbà China atụ ahịa na steeti Anambra, ka ihe wee na-adịrị ha mfe. Ọ sị na ọ dị oke mkpà mba China iwunye ihe na ngalaba omenala na steeti ahụ, ma kwuo na gọọmenti ga-enye ya bụ mbà ala n’efu ebe ha ga-arụ ogige nkwàlite omenala na ya bụ steeti.
Na ntụnye nkè ya, Komishọna steeti ahụ na-ahụ maka ihe e ji aka emepụta n’ala anyị, ihe na-eme na mba ofesi, omenala na njèm nlegharị anya, bụ ọkaiwu Sally Mbànefo tòrò ndị mbà China maka mmasị ha n’iwunye ihe na steeti ahụ nakwa otu ha sìrì zìé ndị ótù sitere Anambra oge ha mèrè mmemme ‘Spring Festival’ n’isi mmalite afọ a, ma kwuo na nke ahụ gosiri na mmekọrịta ahụ dị n’etiti steeti ahụ na mbà ahụ na-amịta nnọọ mkpụrụ ọma a tụrụ anya, ma bụrụkwa nke ga-adịgide ọkpụtọrọkpụ.