ONYE a họpụtara ịnochite anya ọgbọ nta vootu Aguata 1 n’ụlọ nzụkọ omebe iwu steeti Anambra bụ Nnamdi Umeh, ekwela nkwa ịhụ na ezi mmepe na-abatara ndị ọ na-anọchite.
Umeh gwara ndị nta akụkọ nke a na Monde, oge ọ na-eto aka na-achi steeti ahụ bụ Chief Willie Obiano maka ọlụ ya na mbọ ya n’ebe steeti ya nọ kemgbe afọ ise.
O kwuru sị, “Ana m esonyere nde kwuru nde ndị Anambra na ndị bi na ya wee na-ekele ezigbo gọvanọ anyi, Chief Willie Obiano na ncheta afọ ise ya n’ichi Anambra tinyekwara ọlụ niile o jirila ya wee lụọ.”
Ọ gakwara n’ihu kwuo na Chineke ejirila Gọvanọ Obiano lụọ ọtụtụ olu gụnyere ngalaba nchekwa ndụ na akụnụba, ọlụugbo; nke mere na steeti Anambra na-ebufeziri mba ndị ọzọ osikapa.
Umeh gakwara n’ihu n’okwu ya sị; “Anambra sozi n’otu steeti ndị kacha nwe ezi nchekwa n’ala Nigeria. Ọzọ, n’agbanyeeghi na o soghi na steeti ndị ahụ a na-egwute mmanụ, na a na-akwụ ndị ọlụ ụgwo ọnwa tinyekwara ihe niile ruuru ha oge o kwesịrị. Ndị lara ezumike nka na-enwetekwa ọke nke ha. Yaabu, ọchịchị ya bụ ngọzi n’ebe anyi nọ.”
Umeh, onye nke ji otu ndọrọndọrọ All Progressives Grand Alliance (APGA) wee zọ ọchịchi jikwa ohere ahụ kelee ndị ọ ga-anochite bụ Agụata I maka nkwado ha nke mere o jiri turu ugo ma kwekwa ha nkwa ọlụ ọma.
ọ kọwakwara na ọ ga-eji ọnọdu ya dịka onye APGA wee sonyesie ike n’ọlụ ma hụkwa na anya goomenti na-eru na ngalaba iteghete (9 wards) nke dị n’ọgbọ nta vootu ahụ.
O kwekwara nkwa na ọchịchị ya ga-eweta udo, ihunanya na ezi mmekọrịta.