GOVANỌ Willie Obiano, aka na-achị steeti Anambra emekwaana ka o si eme site n’ịgbata ọsọ enyemaka maka ya bụ ihe mberede okporoụzọ dapụtara n’upper Iweka Onitsha na ‘Ibughubu Umuchu. O kwere nkwa na gọọmenti steeti ahụ ga-akwụrụ ndị niile ya bụ ihe mberede metụtara ụgwọ ụlọgwụ.
O kpebikwara ịkwụsị ahia mbugharị n’ihi ihe mberede nke ha na-adabakarị na ya, ma kwekwa nkwa ileba anya hụ na e gbochiri ihe mberede na-eme n’ebe ndị ahụ.
Gọvanọ Obiano gwakwara ndị Anambra ka ha debanye aha ha n’atụmatụ ahụike steeti ahụ ‘State Health Insurance Scheme’ iji nyere ndụ ha aka maka ezi ahụike, ọkachasi n’oge o dara na mberede.
Na ya bu ebe ihe mberede nọrọ wee kpọtụọ n’ahia Afọ Ibughubu Umuchu nke dị n’okpuru ọchichị Aguata, Gọvanọ Obianọ gwara ndị Anambra ka ha sonye n’atụmatụ ichekwaba akụnaụba ha ‘property insurance’ iji gbanari mbibi n’oge ihe mberede. ọ dụkwara ha ọdụ ka ha gaa n’obi okpuru ọchịchị goomenti ha wee debanye aha n’ihe gbasara ahụike ‘State Health Insurance Scheme.’
Ọ gakwara n’ihu gwa ndị ọlụ nchekwa okporouzo ‘Federal Road Safety Corps’ ka ha gba mbọ tinyegasia ihe ndị ahụ na-egbochi ụgbọala ịgba waawaawaa ‘speed limit devices’ iji belata ihe mberede okporoụzọ. o kwukwara na goomenti steeti ahụ ga-akwụ ugwọ ụlọgwụ ndị niile o metụtara.
Ndi soro ya mee njem ahụ gụnyere kọmishọna Uweojii steeti ahụ bụ, Maazi Rabiu Ladodo; kọmishọna ahụike, Dọkịta Joe Akabuike; kọmishọna na-ahụ maka njem, Maazi Uchenna Okafor na otụtụ ndi ọzọ.
Otu onye ọ nọ ka o mere bu Joshua Agbosịrị kwuru sị na nnukwu ụgbọala bụ simenti ji nnukwu ọsọ wee kụrụ ụgbọala tipa wee kụbanye ya n’ime ahịa. ọ kọwakwara sị, “Ndị ọkwọ ụgbọala abụọ ahụ, otu onye osote ọkwọ ụgbọala (conductor) na mmadụ abụọ ọzọ nọ n’ime ụlọ ahia ha (shop) azuru onwe ha ahia tụfuru ndụ ha n’ihe mberede ahụ.