NWA amadi ahụ jibụrụ ọkwa dịka ọka ikpe steeti Abambra, bụ ọka ikpe Peter Umeadị abanyela otu ndọrọ-ndọrọ ‘All Progressive Grand Alliance’ (APGA).
Nke a bụ nke mere ụbọchị Wednezdee, ka ọ gachaara ihe dịka otu izu ụka ya bụ nwa amadi jiri laa ezumike nka n’ọrụ ya dịka onye ọrụ iwu.
N’okwu ya na mmemme ịbanye na ya bụ otu ndọrọ-ndọrọ, maazị Umeadị mere ka a mara na ebumnobi ya jiri banye igwù okwe ndọrọ-ndọrọ ọchịchị bụ ka o soro tụnyekwa ụtụ nke ya n’ịkwàkite mmepe obodo na ezi ọchịchị na steeti Anambra na n’ala Nigeria n’izugbe. O kwukwara na otu n’ime ihe o jiri bànye otu ndọrọ-ndọrọ APGA bụ na ọ hụtara ya dịka otu ndọrọ ndọrọ maara nke ekwe na-akụ, tinyekwuoro na ọ ga-enye ya ohere inyere gọvanọ Obianọ aka n’ọrụ ọma dị iche iche o ji na steeti Anambra.
O mere ka a mara na ọ bụrụ na mmadụ were maka na ọ lara ezumike nka wee rahụbazie ụra, ụbụrụ onye ahụ alabakwuo ezumike nka; ma kwuo na ọ bụ ya mere o ji sị mba, na ya agaghị anọ rahụba ụra, ebe ya ka nwere ọtụtụ ihe n’ime ya nakwa ọnụnụ ọkụ n’obi ịga n’ihu n’ijere ala nna ya ozi.
O tòzịrị gọvanọ Obianọ n’ịgba mbọ ya na ihe dị iche iche o meputagoro na steeti ahụ n’ime ahọ ise gara aga, dụọ ya ka o jide ka o ji, ọ bụnadị dịka o gosipụtara njikere ya inye aka n’ụzọ ọbụla o nwere ike iji hụ na ya bụ ọrụ ọma na-aga n’ihu.
Maazị Umeadị bụzị onye a nabatara nke ọma n’otu ndọrọ-ndọrọ ahụ site n’aka ndị otu APGA n’isi ụlọ ọrụ ime mkpu ya bụ, bụ ime kpu nke abụọ n’Agụ-Ukwu Nri (Nri Ward 2) dị n’okpuru ọchịchị Anaọcha, ma nyekwazie ya akwụkwọ ikike na-egosi na ọ bụrụla onye òtù ndọrọ-ndọrọ ahụ n’ozuzu òkè.