A ga-arụcha ụzọ Ugwunwasike-Azụ Ogbunike tupuu ọnwa May agwụ – Obianọ

0
833

DỊKA oge udummiri na-akpụdobe n’ike, aka na-achị steeti Anambra bụ gọvanọ Willie Obianọ emeela ka a mara na a ga-arụcha okporo ụzọ ahụ siri Ugwunwasike gaa Azụ Ogbunike-Amawa-Osile-Ifite-Umueri-St Monica tupuu ọnwa Mee ahọ a abịa n’isi njedobe.

Gọvanọ Obianọ mere ka a mara nke a n’Ogbunike dị n’okpuru ọchịchị Oyi, oge ọ gara ileta ka ọrụ si aga na na ya bụ okporo ụzọ. O gosìputara afọ ojuju ya banyere otu ya bụ ọrụ ngo si aga na ogoogo e ji arụ ya, ma mee ka a mara na a ga-etinye ọkụ okporo ụzọ na ya nwga ngwa a rụchara ya.

O kwuru na ọchịchị ya ji ọrụ okporo ụzọ ruru kilomita iri anọ na ise na mpaghara ahụ, ma sị na mbize na-akpa ike na mpaghara ahụ bụ nke a ga-elebàrá anya nke ọma, were uche sochie ya azụ ma kpàá ya eze. Ọ gara n’ihu kwuo na a na-edozigharị ebe ahụ e si abànye n’ọgbà Ogbunike na ime ka mma ya pụtakwuo ìhè, bụkwa nke ọ sị na ọ ga-enye aka ịdọta na ịkwàlìtè njèm nlegharị anya n’ebe ahụ.

Ọ dụzịrị ụmụafọ Anambra ka ha jisie ike na nkwàdo ha na-enye ọchịchị ya, iji wee gaa n’ihu n’ọrụ ọma dị iche iche o ji n’aka na ya bụ steeti.

Na ntụnye nke ya, kọmishọna na-ahụ maka ọrụ na steeti ahụ, bụ maazị Marcel Ifejiọfọr kwuru na e nyechaala onye ji ya bụ ọrụ ngo ihe ndị kwesiri iji rụchapụ ya bụ ọrụ, ma mekwazie ka a mara na e teela ihe karịrị kilomita ise n’okporo ụzọ ahụ dị kilomita iri na abụọ. O gosipụtazịkwara ezi olile anya o nwere na a ọrụ ga-akụrụ ọnụ ebe ahụ n’oge a tụrụ anya ya.

GUO:  COVID-19: Gọọmenti ga-enyeghàchi ndị mmadụ pasentị iri n'imeu ụtụ Isi ha kwụrụ na 2019 —Obianọ

Maazị Yinka Amosun, bụ onyeisi ụlọ ọrụ ngo ji ya bụ ọrụ kwèrè nkwà ịrụchapụ ma hafee ya n’oge e kwùrù na n’ogoogo kwesiri ekwesi, ebe kọmishọna na-ahụ maka njèm okporo ụzọ, bụ maazị Uchenna Okafor kwuru na a rụchaa ya, na okporo ụzọ ahụ ga-enye aka n’ịkwàlitè njem siriri werere na mpaghara ahụ

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here