September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

A tụọla nwa akwụkwọ mahadum mkpọrọ maka igwu ojoro n’Intarneti’

A TỤỌLA otu nwata akwụkwọ nke nọ n’ogo ikpeazụ na mahadum ma na-akwado maka njem ife ala Nigeria (NYSC) mkpọrọ ọnwa anọ. Ọ bụ Justice Ibrahim Watilat nke ụlọikpe ukwu dị n’Abeokuta ‘Judicial Division’ tụrụ ya bụ nwoke Soyombo Omogbolaham Ridwan mkpọrọ maka igwu ojoro n’ụdị usoro mgbasa ozi ọnya nwudude (internet fraudster).

Mgbe ọ na-agụpụta ikpe ya onye ọkaikpe ahụ kwuru na mkpọrọ ọnwa anọ ahụ malitere dịba ire ka ọnwa Febụwarị dị n’abalị iri na atọ n’afọ a bụ ụbọchị a nwụchịkọrọ ya bụ onye omekome. Ụlọikpe ahụ nyekwara iwu na site n’aka ‘Federal Republic of Nigeria’ na Soyombo ga-akwụchịgha James R. Dunford na Cara Melton bụ ndị o megidere ego USD $700.

Ọ ga-ahapụwaziri gọọmentị Nigeria akọrọngwa ya ndị a: ‘Apple Macbook Air laptop, Iphone X mobile phone na Wifi Router’. Akọrọngwa ndị ahụ bụ ndị o ji alụ ọlụ ọjọọ , ma bụrụkwa ndị a natara ya oge a nwụchịkọrọ ya.

 

 

%d bloggers like this: