September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

E liela Fada Okpala n’Awka

ỤBỌCHỊ Monde ọnwa Maachị dị n’abalị iri abụọ na ise ka e liri ozu Rev Fr Emmanuel Anayochukwu Okpala (Acada) ka a kachaara ya ụka n’obi Chukwu ‘St Patrick’s Cathedral’, Awka.

Emume elimozu ahụ, nke dọtara ọtụtụ ndị ụkọchukwu, ndị echichi ndị ọzọ tinyekwara ọtụtụ ndị ọnụ ruru n’okwu na ndị si dayọsis Ogoja ebe ụkochukwu ahụ lụburu ọlụ bụ bishọọp ụka Katọlik dayọsis Awka, ‘Most Rev’ P.C Ezeokafor nọrọ n’isi ya. Bishọọp kelere Chineke maka ndụ nke ụkọchukwu ahụ nwụrụ anwụ na ọlụ ya n’ụka ma n’obodo. Ọ gara n’ihu rịọ Chineke ka ọ nabata ya n’alaeze ya.

N’okwuchukwu, ‘Fr’ Anthony Udogu bụ onye ya na ‘Fr’ Emmanuel chikọrọ ụkọchukwu n’otu afọ (1995) kọwara ọnwụ dịka njedebe nke ndụ nke e nweghị ike ịgbanwe agbanwe.

‘Fr’. Udogu kwuru na ‘Fr’ Emmanuel dị uchu n’ọlụ. O kwuru si, “Fada bụ ụkọchukwu dị nkọ, onye ya na ndị mmadụ na-enwe ezi mmekọrịta. Ọ hụrụ ọkpụkpọ oku Chineke kpọrọ ya dịka ụkọchukwu n’anya. Ana m ekele Chineke n’ihi ndụ ya. O metụtara ndị dayọsis Ogoja nke mere ha ji nọrọ ebe a n’ụbọchị taa.”

Ọ gara n’ihu chetara ndị ụka na onye ọbụla ga-anwụrịrị anwụ, ma onye ukwu ma onye nta, ma dụkwaa ha ọdụ ka ha hapụ asịrị ma lekwasa Chineke anya. Ọ gwara ha ka ha mịa mkpụrụ ọma. Mkpụrụ ihunanya na ezi ọlụ nke ga-eduba ha n’alaeze eluigwe.

Ụkọchukwu bụ ‘diocesan chancellor’ ‘Fr’. Francis Chidume gbara ama na ‘Fr’ Emmanuel, onye nke nwụrụ ụbọchị e ji echeta Valentine dị asọ, nwụrụ ọnwụ añụrị. O kwuru na ọ nọ na-egosịpụta ọñụ oge ọnwụ ya na-abịa nso. Ọ kọwakwara agadi nwaanyị nne ya dịka onye nwere okwukwe na Chineke, tinyekwara ezinaụlọ ya.

N’okwu nke ya, Fr. Anthony Ezeoke bụ ụkọchukwu nọ n’isi n’ihe gbasara akwamozu ndị ụkọchukwu nke dayọsis Awka kọwara ya dịka ezigbo mmadụ nwere obi umeala, ma nwekwaa nsopụrụ zuru oke n’ebe mmadụ nọ. O kwuru na ọnwụ ya dapụtara na ntụmadị.

Rev Fr Herbert Ezeji, ụkọchukwu parish St Michael’s Nawgu sokwa na ndị otu ya kwuru sị: “ọ bụ ezigbo enyi m. Ana m abịa na nke ya na-anọnyere ya oge m na-agụ akwụkwọ. Ọ hụrụ ụkọchukwu nke ọ bụ n’anya ma gbaa mbọ igosi ya na ndụ ya. Ezigbo mmadụ n’ihe nile ma nwekwaa onyinye amara na ngalaba dị iche iche; egwuregwu, mmụta, mmekọrịta mmadụ na ibe ya, ma nwekwaa mmasị ịnyere ndị nọ na mkpa aka.”

Oriakụ Adeline Ofor, onye nke si St Joseph’s Achina ma bụrụkwa otu n’ime ndị ụmụnwaanyị ‘life member’ dayọsis Awka kwuru na ọnwụ ya wutere ha nke ukwu n’ihi na ọ bụ nwa ha, o bu ha kwadoro ya na njem ụkọchukwu.

O kwuru na ọ gara amasị ndi otu ahu iso ya ñụrịa n’emume afọ iri abụọ na ise o ji bụrụ ụkọchukwu ‘Silver Jubilee’ nke na-abịa n’afọ ọzọ.

Fr Martin Okafor, onye nkuzi na ‘Federal College of Education (Technical)’ Umunze ma bụrụkwa onye nọbugoro n’Amesi kọwakwara ya dịka mmadụ  ọha ma kwuo na aha ndi mmadụ na-etu ya ‘Obioma’ kọwara ihe nile.

N’akụkụ nke ya, Magret Mary Ezeilo onye nke e jiri ‘Nurse’ wee mara si St Anthony ‘Parish’ Nanka. ji obi mwute wee kwuo si, “Fada bụ ụkọchukwu parish anyị n’oge gara aga. Ọ bụ mmadụ ọha, dị uchu n’ọlụ, ma bụrụkwa onye udo. Ọ bụ nke a kpatara na agaghị m ọlụ taa.”

Rev Sr Mary Easther Udeagha, onye Amesi kwuru na ọnwụ ụkọchukwu ahụ gbawara ya obi ma otu o sila dị, ọ kọwara ya bụ ihe merenu dịka nke bụ uche Chineke.

Ndị ụkọchukwu ha na ya chikọrọ n’otu afọ, ‘The 1995 set of Awka Diocesan priests’ gụpụtara ọtụtụ ihe gbasara ya mgbe a nọ n’ili nke gụnyere na ọ bụ onye na-enyere ndị nwere nsogbu aka nke mere ndị parishi ya ji akpo ya ‘Fada Obioma’.

N’ihe ngụpụta ha n’ili ndị ‘Life members’ dayọsis Awka bụ ndị zụpụtara ya dịka ụkọchukwu kwuru na ọnwụ ya ghasara ha oge ha nụrụ ya ma tokwaa ya n’ihi  ezi ọlụ ya. Ọtụtụ ndị mmadụ tinyere aka n’ozi ahụ ha gụpụtaara ya nke gụnyere Lady Agatha Chukwuma, onyeisioche otu ahụ.

%d bloggers like this: