DỊKA a sị na e too onye gburu ewu, ọ hụ ehi o gbuo, e toola ụlọ ọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation, bụ ụlọ mbipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na Sportslight Xtra, maka ezi mbọ esepughị aka ọ na-agba n’ịkwàlite asụsụ Igbo na ịhụ na ya bụ asụsụ anwụghị.
Otuto a bụ nke bịara site n’aka ụlọ ọrụ Radio Nigeria, Enugu na mmemme asọmpi n’asụsụ a chịkọbaara ụlọ akwụkwọ Sekọndịrị dị n’Enugu, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n’ụlọ ọrụ Coal City FM, bụ isi ụlọ ọrụ mgbasa ozi Radio Nigeria na steeti ahụ.
N’okwu ya dịka ọ na-enye ụlọ ọrụ National Light òtùtó ahụ na akwụkwọ ozi so ya, onyeisi nhàzi ụlọ ọrụ Federal Radio Corporation of Nigeria n’isi ụlọ ọrụ nke ụlọ mgbasa ozi ahụ na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala anyị, bụ maazị Ike Okere kọwara ya dịka nke kwesiri ekwesi n’ilekwàsị anya na mbọ dị iche iche pụtara ihè ụlọ mbipụta akwụkwọ akụkọ ahụ gbàgòrò n’ịkwalite asụsụ Igbo, ọ kachasị site n’ibipụta akwụkwọ akụkọ “Ka Ọ Dị Taa” bụ akwụkwọ akụkọ e dere n’asụsụ Igbo.
O mere ka a mara na ọnọdụ asụsụ Igbo nọ na ya n’ụbọchị taa bụ nnọ nke na-agba anya mmiri n’ihi na ọtụtụ ndị Igbo agbakụtala ya azụ ma na-emesòzị ya ka asụsụ nwaokpùrù, kọwaa nke ahụ dịka ihe jọgburu onwe ya, ma kpọkuokwa onye ọbụla bụ ezi nwaafọ Igbo ka o were asụsụ Igbo kpọrọ ihe ma na-asụkwa ya kwà ụbọchị.
O bunyere ụlọ ọrụ National Light ụkpa ekele maka ịhụta mkpa ọ dị na a kwàlitèrè ya bụ asụsụ ma chekwaba ya ka ọ ghara ịnwụnyụ anya dịka ndị òtù mba ụwa ‘United Nations Education Scientific and Cultural Organization’ (UNESCO) bùrù n’amụma n’ahọ 2012.
O mere ka a mara na ụlọ mgbasa ozi, ọ kachasị ụlọ mbipụta akwụkwọ akụkọ so n’otu ụzọ pụtakarịchara ìhè a pụrụ isi kwàlite asụsụ Igbo, n’ihi na ọ ga-enyere ndị mmadụ aka ịmụ otu e si agụ, otu e si asụ na otu e si ede ya bụ asụsụ. Ọ jakwazịrị ụlọ ọrụ ahụ ike n’ịzọpụ ụkwụ dike ahụ, bụ nke o kwuru na ọ bụ ihe kọrọ ụkọ n’ala anyị, ma dụkwazie ha ka ha jide ka ha ji ma gaa n’ihu n’iti ịgbà ahụ n’ihi na mpụtara ya bara ụba.
Na mbụ n’okwu ya na mmemme ahụ, otu onye n’ime ndị ikpe na ya bụ asọmpi ma bụrụkwa nwa amadi aha ya na-ada ụda n’ide edemede n’asụsụ Igbo, bụ maazị Chinedum Ọfọmata kwàrà àrịrị bànyere ọnọdụ asụsụ Igbo nọ na ya ugbua, tòó ndị chịkọbara ya bụ asọmpì, ma kpọkuzie ụmụakwụkwọ na ụlọakwụkwọ sonyere na mmemme ahụ, ndị nne na nna na ụmụafọ Igbo n’izùgbe ka ha were asụsụ Igbo kpọrọ ihe ma werekwa ya na-ekwurịta okwu oge ọbụla.
N’ozi nnọọ ya, onye chịkọbara ya bụ asọmpi, bụ maazị Ibiam Ufiem, onye jiri otu ahọ wee fèé ala nna ya n’ụlọ ọrụ ahụ, kọwara na ebumnobi o jiri chịkọba ya bụ iji wee nwàléé ụbụrụ ụmụakwụkwọ ahụ n’asụsụ Igbo, mee ka ha ghọta mkpà ọ dị na oke uru ọ bara, bụ ịma asụ na ịma ede asụsụ Igbo, ma sikwazie n’ụzọ dị òtù ahụ kwàlite ya bụ asụsụ, bụ nke ọ kwara arịrị na ọtụtụ ndị ntorobịa amaghịzị àsụ ma ya fọdụzie ide ya ede ugbua.
Ndị tuuru ùgò na ya bụ asọmpi gụnyere: Urban Girls Secondary School, Enugu (gbárá ndị nke mbụ); New Layout Secondary School, Enugu (gbárá ndị nke abụọ); Day Secondary School Enugu (gbárá ndị nke atọ); and Lady Ibiam Girls Secondary School (gbárá ndị nke anọ).