NNUKWU mmiri nke zoro ụbọchị ụka gara aga achụpụla ihe karịrị otu puku mmadụ n’ụlọ n’Oghara nke dị n’okpuru ọchịchị Ethiope ‘West’ na steeti Delta.
Ndị nile bi na mpaghara ahụ nọzi na nsogbu n’ihi na ha amaghị ihe ha ga-eme. Ha bidoro kwawa ngwongwo ha na mmiri ahụ n’ike n’ike.
Maazị Abel Imonina gwara ndị nta akụkọ n’onweghị ebe ya na ụmụ ya asaa ga-alarụ ma kwakwaaa arịrị na o tufuru ngwongwo ruru nde naịra n’ide mmiri ahụ nke tokporo ụlọ ha ma mezie ka ha gbara aka.
Otu onye ọkwọ ụgbọala onwe ya ekweghị njide ji ibe akwa wee gwa ndị nta akụkọ na ya bitere ego ebite wee gote ụgbọala iji wee na-enye ezinaụlọ ya ihe oriri ma ugbu a ide mmiri etokpola ụgbọala ahụ.