OBODO nille Chukwu kere nwere usoro Chukwu gosiri ha etu ha ga esi na akpọku Ya, ya na usoro ha ga eji na eme emume nke ime mmụọ. Ndị Bekee kpọrọ usoro nke ya, EKPERE (Prayer), mana Igbo kpọrọ nke ha, Ị GỌ ỌFỌ (Declarations).
Ọzọ, obodo niile nwekwara ihe dị iche iche ha ji akpọkù Chukwu na mmụọ ndị na emere ha ihe. Ndị Bekee na ndị otu Kristi kpọrọ ihe ndị ahụ ha ji e me Ekpere, SAKRAMENTALS. Chaplet, kandulu, Mmiri nsọ, mmanya nsọ, achicha nsọ, insensị, na mmanụ nsọ socha na ngwongwo ha ji e me ekpere, ndị a na akpọ Sakramental.
Onwekwara ndị ji Mpempe-akwà a kpọrọ Handkerchief na Nnú nwere e me ekpere. Ngwongwo ekpere ndịa nwegasịrị ihe ha na-arụ.
Etu ahụ ọdị na Ụkà nwa Bekee, ka ọ dịkwà na Ọdịnanị Igbo.
Anyị nwere ọtụtụ ihe dị iche iche anyị ji A GỌ ỌFỌ. Mana ndị aha ha na ada-ụdà bụ, ỌJỊ, NZU, EDÒ, MMANYA, MMIRI. Onye Ọdịnanị na omenala Igbo nwekwara ike i ji Nnú, Ọkụkọ, Ewu na ihe ndịọzọ gasị nwere Gọọ Ọfọ.
N’eziokwu, onye ọdịnala nwere ike i ji iheọbụla mmụọ ya gwara ya nwere gọọ ọfọ, mana ihe ka mkpà bụ na ọrụ ihe ahụ na arụ ka ọ ga-eji were kwubie okwu.
Ọjị Igbo bụ otu ihe kachasị mkpà e ji agọ ọfọ. Onye ọbụla kwesịrị i nwe ọjị n’ụlọ, maka na ihe Igbo ji ọjị e me kankụ. Ọjị adịghị e pe mpe, etu ọbụla ọjị ha, a ga e ji ya were gọọ ọfọ. Mana ihe kachasị mkpà bụ na ọ ga abụrịrị ọjị Igbo.
Ọjị gbara mkpị atọ, anọ, ise, isii, asaa nwere gawa, bụ ezigbo ọjị. Mana nke gbara ibe abụọ, a na akpọ ya Ọjị Ogbi (Dumb Kola) anaghị ata ya ata. Ọjị gbara ibe ịtọ bụ ọjị Ikenga, sọọsọ onye wara ọjị ahụ ga-achịkọrọ ya taa. Ọjị gbara ibe anọ amaka, maka na ọ nọchitere ahịa anọ Igbo ji biri. Ka ibe ọjị na aba-ụba ka o na-enwe ugwù pụrụiche na anya ndịgbo.
Nzu bụ ihe si ‘n ime ala nwere pụta. Na agbanyegị na nzu dị n’ime ala, ọ na achaọcha pụrụ iche. Ihe Nzu pụtara na Ọdịnanị Igbo bụ Udo na Obi dị Ọcha. A na e ji ya e go si aka di ọcha.
Mgbe mmadụ nyere onye ọbịa nzu, nkea na e gosi na ọ nabatara ya n’obi ọcha. Mgbe anyị na akpọ Chukwu na Ndịmbụ ka ha bịa tụọ nzu, ihe ọ pụtara bụ na anyị chọrọ ka ha bịa nonyere anyị na obi dị ọcha, na anyị chọkwara ka mmekọ anyị na Ha bụrụ mmekọ ndụ.
Ụfọdụ oge anyị na e ji ụzọ ole nwoke kàrà nzu na ala aghọta ma o chiri ọzọ. NWoke ọ bụla chiri ọzọ na a kà nzu ụzọ asatọ maọbụ karịa. Mana onye ga e chibeghị ọzọ ga a kà nzu ụzọ anọ. Nzu bụ ihe ọñù.
Mmanya so kwa na otu ihe dị mkpà anyị ji agọ ọfọ na ọdịnanị Igbo. Mmanya ngwọ, mmanya nkwụ na mmanya ọkụ bụ ụdịrị mmanya anyị ji Agọ Ọfọ karịsịa. Anyị jikwa mmanya ọtọ-biribiri a gọ, ọkachasị mgbe anyị na achọ ka ihe ụtọ mmee na ndụ anyị.
Cheta , n’ime Omenala Igbo, ọrụ ihe ọbụla anyị ji na arụ ka e ji ekwubi okwu maka na ọ ihe nyiri ihe ka e ji ama atụ. Onye chọrọ ihe ọma ga ekwu ihe iheọma ahụ nyiri, maka na Igbo kwuru sị, “onye sị na ihe na atọ ụtọ, o kwuo ihe ọ na atọ ka ya”.
Igbo ga adị
Nnaa Biko asi m ka m juo, mmadu onwekwara Ike iji ose ogo ofo