ỤLỌIKPE ‘Isolo Chief Magistrate Court’ nke dị na Lagos atụkpoola otu nwoke aha ya bụ Michael Essien na nga maka iwu nwunye ya mmiri ọkụ juru otu ite.
Onye ọkaikpe okwu dị n’aka bụ Oje Uagbale, kọwara nwoke ahụ dịka onye na-etinyere nwuye ya anya (jealous lover).
O nyere nwunye ya bụ Mariam Essien iwu ka ọ hapụ ịdị na-enwe mmekọrịta n’ebe ndị agbataobi ha nọ. Di na nwunye ahụ ebiela afọ olemole ma jide ụmụ abụọ.
Onye uweojii okwu dị n’aka n’akụkụ nke ya kwuru na nsogbụ dapụtara ụbọchị ya bụ nwoke lọtara ọlụ wee hụ nwunye ya n’usoekwu (kitchen) ebe ya na nwunye onye agbataobi ha na-akpa nkata.
O kwuru na nwoke ahụ ji iwe na nwunye ya nupuuru ya isi wee buru mmiri gbọrọ agbọ nke nwunye ya sinyere iji see semovita wee wụọ ya.
O kwukwara na nwaanyị ahụ merụrụ ahụ nke ukwu ma nọrọ n’ụlọọgwụ ebe ọ na-anara ọgwụgwọ.
Ka ọ dị ugbu a, onye Majie ji ya bụ okwu, Oriaku O.A Teluwo enyela iwu ka a tọhapụgodụ Essien (bail) n’ọnọdụ ịkwu otu narị naira tinyekwara otu onye maara ya (surety) n’ụdị ọnụ ego ahụkwa. O kwuru na ọ ga-anọgọdu na nga ruo mgbe o wetezuru ihe e kwuru.
E yigharịrị ikpe ahụ ka ọ dịbazie ma ọnwa April dị n’ụbọchị iri na asaa; ebe onye a wụrụ mmiri ọkụ ka nọ n’ụlọọgwụ ka a mara ma ọ ga-adị mma.