OTU ụbọchị, égbé gwara nwa ya ka ọ gaa chọọ ihe ọ ga-eri. O wee pụa bute nwa ọbọgwụ. Mgbe ọ lọtara, nne ya jụrụ ya “Gịnị ka nne ya mere mgbe ị buuru nwa ya?” Ọ sị ya ‘ọ dịghị ihe o mere”.
Égbé sị nwa ya “bụghachi ya azụ, ọ bụghị anụ oriri ebe ọ bụ na o nweghị ihe o mere n’ihi na ọ gbara nkịtị nwere ihe o bụ n’obi.”
Nwa egbe bughachiri nwa ọbọgwụ wee bute nwa ọkụkọ. O rue mgbe ọ lọtara, nne ya wee jụọ ya ọzọ “Gịnị ka nne ya mere?” Ọ sị ya na nne ya chụrụ ya oke ọsọ, felie, fetue, tisie mkpu ike, kpọọ ndị nne ya ochie na ndi nna ya ochie. Tiee! Ewoo! Ewoo! Nwa m oo!
Nne égbé sị nwa ya, “Ehee! Nke a bụ nke anyị.” Buru ya debe ka anyị rie na nke a bụ ezigbo anụ oriri n’ihi na nne ya emechaala ihe nile o nwere ike ime.
Ọ bụ nke a mere na égbé adịghị ebu nwa ọbagwụ wee rue taa.