ỤLỌ ọlụ ‘National Agency for Food and Drug Administration and Control’ (NAFDAC) amaala ọkwa maka ọgwụ adigboroja nke a kpọrọ ‘Dukoral Oral Cholera Vaccine’ nke a na-ekesa na mba Bangladesh.
Onyeisioche ‘Director-General’ nke NAFDAC bụ Ọkammụta Moji Adeyeye n’ozi ya dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ma kwuo na e ji asụsụ bekee (English) na ‘French’ wee depụta ihe n’ọgwụ ọjọọ ahụ.
Adeyeye kwuru na ‘World Health Organisation’ (WHO) ekporola ma kpọchie ọtụtụ ọgwụ ahụ.
Ọ gakwara n’ihu kọwaa si na ha na-eme ka ndị ọlụ ahụike na ọhaneze mata maka ya bụ ọgwụ, ma rụtụkwa aka na ndị WHO tinyekwara ndị okwu ahụ ike dị n’aka na Bangladesh akpọchiela ọgwụ ‘Dukoral Oral Chorela Vaccine’ ahụ nke dị ngwugwu puku asatọ, nke bụ ole ha chọpụtarala.
Nwaanyị ahụ nọ n’isi na NAFDAC kọwara na ndị na-alụ ọgwụ ‘Dukoral Oral Chorela Vaccine’ nke ezigbo ya bụ ‘Valneva Canada Inc’ enweghị akara NAFDAC. N’ihi ya ọ dọrọ ndị nile na-ere ma na-ekesa ọgwụ tinyere ndị na-atụ mgbere ya ka ha kpachara anya ha.