ONYEISIOCHE otu jikọtara ndị Nigeria bi South Africa bụ Maazị Benjamin Okoli akwaana arịrị maka ogbugbu nke e gburu otu nwa afọ Nigeria bị ebe ahụ bụ Maazị Ire Chinello ka ọnwa Maachị dị n’abalị iri atọ na otu site n’aka ndị amaghị.
Okoli, onye kwupụtara nke a site n’okwu ọ gwara ndị ‘News Agency of Nigeria’ (NAN) Abuja kọwara ogbugbu ahụ e gburu ya bụ nwa amadị dịka nke jọgburu onwe ya.
O kwuru na ogbugbu ahụ bụ nke dapụtara site n’ihe gbasara nsọgbụ ajọ otu nzuzo ‘cult’ nke dị n’etiti ndị Nigeria bị mba South Africa.
O kwupụtara na a gbagburu ya bụ nwoke onye nke e jiri Ire wee mara na Sunnysidde Pretoria South Africa.
Ọ gara n’ihu kọwaa na ọtụtụ ndị Nigeria atufuola ndụ ha site n’ihe gbasara otu ọjọọ (ihe karịrị mmadụ iri abụọ na ise) n’ime afọ abụọ.
Okoli kwuru na ụdị agwaa ọjọọ ahụ emeela ka ndị ha nọ be ha bụ ndị South Africa na-ehuzi ha dịka ndị iberibe; ebe ndị uweoji na-ahụzị ha ka ndị ogbu ọchụ, otu ọjọọ ‘cultists,’ ndị omekome, tinyekwara ndị na-ebu ọgwụ ike nke mere na ha anaghị ejizi ihe gbasara ha akpọrọ ihe.
Ọ rịọzịrị ndị isi ọchịchị mba ahụ ka ha na-eleru anya n’okwu nile nke dapụtara oge ọbụla ma kpee ikpe ziri ezi.
Onye bụ ‘Consul General’ nke Nigeria na Johannesburg South Africa, Maazị Godwin Adama kwukwara sị; “ogbugbu nke gbadoro ụkwụ na ihe gbasara otu ọjọọ ‘cult’ n’ime ụmụ Nigeria agafeela oke na South Africa.”