September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Nwata akwụkwọ esila n’elu mango daa, nwụọ

OTU nwata akwụkwọ nke ‘Ijo Mimo High School, Akure,’ aha ya bụ Temitayo Oluwole esila n’elu osisi mango daa wee nwụọ.

E kwuru na ọ bụ onyenkuzi ha, Oriaku Kura ziri ya ka ọ ghọtara ya mango ka ha mechara ọmụmụ  ihe ụbọchị Satọdee.

Nwata akwụkwọ ahụ bụ onyeisi ụmụakwụkwọ ‘senior prefect’ bụ onye nke anọ darala ma nwụọ n’osisi mango ahụ nke pụtara na ụmụakwụkwọ atọ anwụọla na mango ahụ na mbụ.

Mgbe ọ dara ada ahụ ma kụọ isi n’ala, a gbara mbọ izọ ndụ ya site n’ibu ya gaa ụlọọgwụ atọ tupu ọ nwụọ na ‘Trauma Centre,’  Ondo.

N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ n’Akure, onye uweojii ‘image maker’ nke steeti ahụ Femi Joseph kwuru  na ahụbeghị onye nkuzi ahụ ziri Temitayo ka ọ ghọtara ya mango, wee nye iwu ka o jiri ọsọ wụchaa n’ogige ndị uweoji.

%d bloggers like this: