ỤBỌCHỊ ụka gara aga bụ ụka nne, nke so n’otu ihe e jiri mara ndị otu ‘Christ’ n’ụwa nile. A bịa na ‘Anglican Communion’, ụka anọ n’ime lent na-abụ ụka ndị nne n’ụwa nile.
Ihe o jiri danye n’ime lent bụ n’ihi na n’ime lent, a na-anọ n’obubu ọnụ mana ụka anọ n’ime lent bụ ụbọchị a kpọrọ na ọnụ oyibo ‘Refreshment Sunday’ dịka ọ dị n’usoro e ji aka ụka.
Ọ na- abụ ụbọchị ndị na-ebu ọnụ ji eneta onwe ha, rie nri, rijuo afọ were nwekwa ike iji were gaa n’ihu ibu ọnụ izu ụka olemaole fọdụrụ tupu na abanye izu ụka Nsọ.
Ụbọchị ụka nne na- abụ oke ụbọchị e ji eri nnukwu oriri na ọñụñụ dị iche iche. Ọ na – abụ ụbọchị ndị bụ nne ji eneta ndị di ha, ụmụ ha, ikwu na ibe, agbata obi, ụmụ akwụkwọ dị iche iche, ndị ụwa na-atụ n’ọnụ, ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ na ndị ọzọ dị iche iche.
Ndị nne na-eji oge ahụ gaa nleta n’ụlọọgwụ dị iche iche. Ha na-ebu ọtụtụ ihe oriri dịka achịcha bekee, osikapa, mmanya ọñụñụ, akị oyibo na ihe oriri ndị ọzọ. Ụfọdụ na-ejikwa akwa ụmụntakiri na nke ndị okenye were gaa nleta n’ebe obibi ndị ụwa na-atụ n’ọnụ.
N’ụlọụka dị iche iche, ndị nne na -enye ndị di ha anọghịzi onyinye dị iche iche iji were gosi ha ihunanya ha nwere ebe ha nọ. Ha na-enwekọrịta añụrị site na- ime ihe ịkpa amụ dị iche iche dịka ịgba ọsọ, ịgosi ekike, ikwu n’ahịrị n’ahịrị ,wdgz.
Ndị nne ‘St Patrick’s Cathedral, Awka’ bụ ndị ụka Katọlik na ndị ‘Cathedral Church of St Faith Awka’ bụ ndị Anglịkan malitere emume na Satodee.
Ndị ‘St Patrick’ buru ụzọ kụrụ bandị n’ụtụtụ Satọdee ahụ gagharịa. Ha si n’ụlọụka ha kụrụ ya gaa Nkwo Amenyi wee lọchighatakwa.
Oriaku Rose Otue bụ otu onye n’ime ha kwuru na ha mere nke ahụ iji gwa ụwa maka mmemme ha na-eme. O kelere Chineke maka onyinye nke ndụ ma rịọkwaa ya maka ngozi.
Ka nke ahụ gachara, ụkọchukwu nọ n’isi n’ụlọụka ahụ ‘Cathedral Administrator’ bụ ‘Rev Fr’. Mathew Attansey kara aja maasị dị asọ ebe ọ nọ gwa ha ka ha ñomie Mary, nne dị asọ ma tọọrọ ụmụ ha ezi ukpụrụ.
Onye isi ụmụnwaanyị ahụ bụ Oriaku May Atah kelere Chineke maka ndụ nke o nyere ha. Ọ dụrụ ụmụnwaanyị ọdụ ka ha sie ike ma soro nzọ ụkwụ ụfọdụ ụmụnwaanyị n’akwụkwọ nsọ dịka Mary, Esther, Hannah na Veronica; bụ ndị gbara mbọ mee ihe dị mma n’agbanyeghị nsogbu gbara ha okirikiri nke ọ kpọrọ ‘Boko Haram’ nke oge ahụ.
‘Rev Sr’ Patricia Osineme (HHCJ) gwara ha ka ha na-akpọkụ Mary n’ekpere bụ onye nlekọta nke ndị nne.
N’okwu nke ya, Oriaku Mary Theresa Agha bụ onye gwara ha okwu nke mmụọ gwara ha mkpa ọ dị ibi n’udo na ichụ aja mgbe nile iji gbanari ihe ọjọọ.
Na ‘Cathedral Church of St Faith, Awka’ ndị nne ji mgbede wee gbakọọ na Satọdee ahụ nke ha kpọrọ ‘social evening’.
He mere ihe ngosi dịka ịchọ mma, marchin, ọsọ akpa na ọtụtụ ihe ngosi ndị ọzọ.
Onyeisioche otu na-ahazi mmemme ahụ bụ Lady Ify Nwobu gwara ndị nne ka ha na-asọpụrụ ndị di ha. Ka ha bụrụ ndị nwunye na ndị nne nwere ntụkwasi obi.
Ọ rụtụkwara aka na ọ dị mkpa ndị nne ịzụ ụmụ ha nke ọma n’ihi na ọ bụ ụmụaka a zụrụ nke ọma na-elete ndị nne na nna mgbe ha mere agadi n’ihi na ọ bụ nkụ mmadụ kpara n’ụtụtụ ka ọ na-anya na mgbede.
O jikwa ohere ahụ too nne na-achị ha bụ Nneora Oluchukwu Okonkwo maka ịgba mbọ ya nile.
N’okwu nke ya, Nneora Rose Obi kwuru na ụka nne ha nke afọ a bụ ọpụrụ iche n’ihi na ha dị nkwadebe.
Ọ kpọkuru ndị nne ka ha na-apụta apụta ka ha wee lụọ ọlụ n’obi ọcha. O kwuru si, “ị pụta ịmụta ihe wee na-alụ ọlụ n’ezinaụlọ gị. Ka ndị nne na-aza oku a na-akpọ ha ka ha wee na-amụta.”
Ka ndị nne mechara emume n’ụlọụka dị iche iche na Satọdee, ha kakwara ụka wee tuo mmamma ụbọchị ụka bụ ụbọchị ha kpomkwem iji kelee Chineke. Ha siri ma kee ndị mmadụ ihe oriri na ihe ọñụñụ, ebe ọtụtụ gakwara n’ihu mekwaa ihe ngosi.