NWAANYỊ so n’otu n’ime ụdị mmadụ Chineke kere n’ụwa ka ọ bụrụ onye nlekọta ihe nile e kere eke. Ọnọdụ adịchaghịrị mmadụ mbụ ekere nke a na-akpọ nwoke mma n’ihi na ọ nọ nanị ya.
Ọ dịghị onye na-akpanyere ya ụka, ọ dịghị onye na-enyere ya aka, ọ dịghị onye na-asị ya jisie ike. Ọ dịghị onye na-eleta ya, ọ dịghị onye na-anọdebe ya, ọ dịghị onye na-akasi ya obi, ọ dịghị onye na-ekpo ya ọkụ. Ọ dịghịkwa onye na-enye ya ihe ọ na-eri.
Ọ bụ n’ihi nke a ka Eke kere ụwa jiri kee nwaanyị ka ọ bụrụ ozuzu oke ma nyekwa nwoke ihe ndị a nke siiri ya ike ịnweta.
Nwaanyị bụ otu nnukwu ihe dị n’ụwa nke na ọ bụrụ na ọnọghị, ihe agaghị na-agacha nke ọma. Ọ dị ọtụtụ ihe dị iche iche eji kee nwaanyị. N’izu ụka ọzọ anyị ga ahụ ya. Ka-emesia.