NDỊ oji egbe aga, ndị nke a na-ele anya na ha bụ ndị isi abaokpu si na agbụrụ Fulani awakpoola obodo Numa nke dị n’okpuru ọchịchị Akwanga na steeti Nasarawa. Ozi anyị nwetara n’ekwu na ọ bụ mmadụ iri na isii ka anapụrụ ndụ ha n’ike ebe ndị ọzọ nwetara ihe mgbụ dị iche iche.
Ogbugbu egburu ndị a biara ka ọgachara izu ole na ole ndị Fulani na-achị ehi wakporo nwatakiri nwagbọghọ Mada, meruo ya ahụ ma gbukwaa ya. Nke a butere ọgbaghara n’etiti ndị obodo ahụ na ndị Fulani na-achị ehi.
Onye omebe iwu na-anọchite anya okpuru ọchịchị Akwanga n’ụlọ omebe iwu ala anyị bụ Senale bụ Philip Gyunka kwuru ezinaụlọ ahụ na-emerube emume igu nwa aha bụ ndị egburu nna, nne na nwa ha nwoke na ya bụ nwakpo.
Ọ gakwara n’ihu katọọ ogbugbo egburu ndị a, okwukwara na nwaanyị dị ime na okenye nke gafegoro afọ otu nari bụ ndị alakwara ndụ ha n’ike. Omekwara ka anyị mata na ndị a gburu ụmụnwaanyị na ụmụaka aka ha dị ọcha.
Onyeisi obodo Mada bụ Samuel Gamu-yare kwuru na ihe nke a mere ha dịka egbe igwe nke n’agba n’abalị. Okwukwara na mgbe ha kpọtụrụ ndị uweojii nọ na mpaghara ahụ, na ndị isi aba okpu a alalari.
O mekwara ka anyị mata na ndị oji egbe aga nwere mkparita ụka ha na ndị na emerube mmemme ahụ tupu ha agbaba egbe aghara aghara, n’ụfọdụ ndị oji egbe aga bụ ndị ha hụrụ ihu ha nke ọma bụrụkwa ndị enyefegworo aha ha n’aka ndị ọlụ nchekwa.
Okwukwaziri na ajọ ọnọdụ a bụ ihe ha na-atụghị anya ya, na nke agbagwojuru ha anya bụ na obodo Mada bụ obodo ọma nke e ji udo na ihunanya na idi n’otu were mara na ha amaghịzị ihe mere ndị otu Fulani na-achị ehi ga-eji tinye ha n’ajọ ọnọdụ a.