A NWỤCHIKỌỌLA mmadụ asatọ na steeti Anambra maka ime na itinye aka n’ihe na-ebute mmebisi gburugburu, bụ ịsa ụgbọala n’ebe na-ekwesighị ekwesi.
Mmadụ ndị ahụ bụ ndị a nwụchikọrọ na mpaghara okporo ụzọ awara awara ahụ siri Enugu gaa Ọnịtsha, site n’aka ụlọ ọrụ na ahụ maka gburugburu na steeti ahụ, na njikọ aka ya na ụlọ ọrụ steeti ahụ na-ahụ maka nsogbu agbakata akwụrụ n’okporo ụzọ, bụ ụlọ ọrụ ‘Anambra Traffic Management Agency’ (ATMA).
N’okwu ya banyere nke ahụ, kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka gburugburu, bụ maazị Mike Okonkwọ kwuru na nnwụchikọ ahụ a nwụchikọrọ ndị ahụ dabara nnọọ adaba na mbọ gọọmenti steeti ahụ na-agba ịhụ na e gbochiri nsogbo na mkpamkpa nke ólùlù, mbize na idè mmiri na-akpa na steeti ahụ.
O mere ka a mara na mmiri ahụ ndị ahụ na-asapụta ma na-agbachikakwa n’okirikiri ebe ahụ niile oge ha na-asa ụgbọala nà-emebisi okporo ụzọ na gburugburu ebe ahụ, n’ihi na ebe ahụ abụghị ebe kwesiri ekwesi ịnọ wee mee ihe dị otu ahụ chaa chaa.
Ọ kwara àrịrị na a dọọla ndị ahụ aka ntị ọtụtụ ùgboro ma degakwara ha akwụkwọ ka ha kwagharịa ọnọdụ ha ma kwụsị ime ihe dị òtù ahụ n’ebe ahụ, mana ha añaghịdịrị ntị, ma ya fọdụzie irube isi, wee ruzie ugbu a nwụchikọrọ ha.
Kọmishọna Okonkwọ kwuru na ihe dị otu ahụ emebiela ọtụtụ ihe, ma wetakwa ọtụtụ ihe mberede okporo ụzọ tagoro isi ọtụtụ ụmụ mmadụ aka ha dị ọcha. Ọ sịrị na ndị ahụ bụ ndị a ga-akpụpụ ụlọ ikpe ozigbo ka e wee kpee ha ikpe ma sikwa n’ụzọ dị otu ahụ mee ka ndị ọzọ na-eme ihe dị otu ahụ mụrụ akọ.
O jikwazịrị òhèrè ahụ wee kpọkuo ndị na-arụnyesi ụlọ na ihe ndị ọzọ n’ebe na-ekwesighị ekwesi na n’ụzọ iwu na-akwàdòghị na steeti ahụ ka ha sepu aka na nke ahụ, n’ihi na ụlọ ọrụ ga na-aga n’ihu n’ịkụkpọsị ihe ndị dị otu ahụ, iji hụ na ya bụ steeti ga-aga n’ihu ịbụ eji ama átụ n’akụkụ niile na n’ozuzu òkè.
Na nzaghachi, onyeisi ọdụ ebe ahụ a na-asa ụgbọala, bụ maazị Chukwunweike Ezenwa, kwetara n’ezie na ikpe mara ha, n’ihi na gọọmenti adọọla ha aka na ntị ọtụtụ ugbòrò bànyere nke ahụ; ma rịọzie biko ka a gbaghàra ha, ọ bụnadị dịka o kwuru na ha amalitelarị ịgbàzì ebe mmiri ha na-asapụta ebe ahụ ga-esi na-apụrụ onwe ya, ma gharizie ịdị na-ehubànyezị n’okporo ụzọ.