September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Emume izuụka dị asọ

IZUỤKA dị asọ bụ izuụka ikpeazu n’ime lenti. Ọ bụ oge ndị otu Kristi n’ụwa niile ji eme emume dị iche iche iji nabata ‘Easter;’. Ọ bụ ụbọchị ụka gara aga ka a malitere ya site n’ịka ụka igu/ọmụ (Palm Sunday).

Emume ụka igu bụ nke e ji echeta ka Jesus si gaa Jerusalem. Ọ nọ n’elu anyịnya ndị mmadụ na-atụrụ ya igu na ihe ndị ọzọ dị iche iche n’ala ma na-ebunye ya otito, na-etu ya aha dị iche iche n’ebe ọ dị ukwuu. N’ihi ya, ndị ụka dị iche iche kara ụka ebe ha nọ gọzie igu ma gagharịa, na-abụ abụ otito.

Ka ụka igu gachara, a banyere n’emume ndị ọzọ na-esota ya. Ndị ụka Katolik bidoro ụnyahụ bụ Wenezdee wee mebe emume (Chrism Mass Cathedratikum) nke a na-anọ na ya gozie mmanụ e ji alụ ọlụ n’ụka dịka ichi ndị ụkọchukwu, ndị eze, ite ndị ọrịa w.d.g. Mmanụ a bụ so n’oge a ka e ji agozi ya. A na-anọkwa na ya nye Chineke onyinye ma gbukwaara ya ehi. Ọ bụ bishọọpụ na-anọ n’isi ya; a na-anọkwa na ya kelee bishọọpụ maka mbọ ya niile.

Na St Patrick’s Cathedral Awka, ọ kpọtụrụ akpọtụ ụnyahụ. E ji aja maasị wee bido ya ma nyekwa onyinye dịka o kwesịrị ebe otu dị iche iche, parishi dị iche iche na ọtụtụ ndị ọzọ na-agụrụ egwu gaa n’ihu bishọọpụ wee gaazie dọba ihe onyinye ha. N’ikwu eziokwu ihe ụwa bụ atụrụ taba.

Taa bụ Tọzdee a ga-agbakọkwa n’ụlọụka  dị iche iche. A ga-asakwa ndị ụka mmadụ iri na abụọ ụkwụ (n’ụlọụka ndị na-eme ya) iji chetara ndị mmadụ etu Dinwenu Jesu Kristi si saa ụmụazụ ya ụkwụ. Ọ bụ ụkọchukwu na-eme nke ahụ. E mechaa, ha ga-eche nche n’abalị ahụ. Otu dị iche iche ga-eme nke ahụ otu awa, otu awa iji cheta ajụjụ Jesus jụrụ ụmụazụ ya sị; “ọ bụ na unu enweghị ike iso m chee nche ọbụladị otu awa?”

Echi bụ Ezigbo Fraidee (Good Friday), a ga-anọkwa n’ekpere ma mekwaa emume nke obe iji cheta ahụhụ nke onweanyị tara n’elu obe. Ụbọchị Satọdee, a ga-akazi ụka abalị iji nabata Ista kpomkwem.

Ozi nke e nwetere n’aka ‘Holy Ghost Adoration Ministry’ nke Rev. Fr. Emmanuel Obimma nọ n’isi ya ma bụrụkwa nke a gbasara ka ọha na eze mata kwuru na izuụka dị asọ bụ oge dị omimi (sacred) n’ime afọ n’ihi na ọ bụ oge a ka anyị ga-eji cheta izuụka ikpeazu nke Jesus biri n’elu ụwa a. O kwuru sị; “Nwa Chukwu, izuụka dị asọ bụ oge a tụrụ anya ka anyị dọwaa obi anyị, ọ bụghị akwa anyị iji chee echiche maka njem ahụhụ na mbilite n’ọnwụ nke onyenweanyị Jesu Kristi. Izuụka dị asọ bụ oge anyị kwesịrị iwepu ihe na-ekwesighị ekwesi anyị na-eme na ndụ anyị.

Anyị kwesịrị itụkwasa uche anyị na obi anyị n’ebe Jesu nọ ya nakwa ihe ndị o megasịịrị anyị. Ka anyị soro ya buru obe, wee kwesị izu oke n’iyi okpu mmeri.” Ọ gakwara n’ihu dụọ ndị mmadụ ọdụ na mkpa ọ dị imezi ndụ ha ma kwupụta mmehie ha n’ime izuụka dị asọ a na Chineke ga-anabata ha dịka nwa lara akụ nna ya n’iyi (prodigal son).

%d bloggers like this: