Ihe ụmụnwaanyị ji achọ mma mgbe ochie

0
168

MGBE mmadụ malitere bawa ụba n’ụwa ka ịchọ mma malitere. Ichọ mma bụ mmadụ idozighari onwe ya na ụdị dị iche ma ile ya anya. Ọ dị ọtụtụ ihe dị iche iche ụmụnwaanyị ji achọ onwe ha mma na abụghị akwa na akpụkpụ ụkwụ, iyeri ntị na ihe ọnụ n’oge ochie.

Ihe ndị a bụ uhie, edo, nzu, tanjere, uri, aka a na-eyi n’olu na ọdụ a na-agba n’aka. Ihe ịchọ mma ndị ahụ a na ete adịghị ahi aru mmadụ ahi ma ọbụ igbaji aru ma ọbụ iru onye na ete ya. Ọ dịghị enye aru nsogbu ọbụla chaa.

N’oge ochie, nwaanyị ọbụla mara ka esi achọ mma adịghị agha ite uhie, nzu ma ọ bụ edo kwa abali ọbụla. Chi fo, ọ gaa na mmiri saa arụ nke ọma, ọ bata, owere enuakị tee arụ ya nile, were tanjere tee n’anya ya, dozie ntutu isi ya nke ọma.

Ọ bụghị ha ncha n’akpa isi kama ha na ara ntutu isi ha nke ọma. O to fee oke, ha esebellata ya ala ka o wee dị mma. Ịhu nwaanyị dị otu a, ọ dị mma ile anya mana akwọ mara mara.

Na mgbe ahụ, ihe ịchọ mma dịka aka na ọdụ bụ ihe e ji amakari adaeze ma ọbụ onye ndị mụrụ ya ji ego nakwa jigida ọ ga eyiju ukwu ya. Ihe ịchọ mma ndị a ana ete bụ na-esi n’osisi ma ọbụ e gwuta ya n’ala.

Uhie bụ osisi. Ndị nwere osisi ahụ n’ala ha gbutue ya, ha akwọbisie ya mkpirikpi, ndị na-azụ ahịa uhie abịa goro ya. Ha na-enwe anyụ ike dị iche iche ha ji awa osisi ahụ, emesia ha e kponye ya na ikwe, suo ya nke ọma. Ha susia ya, ha a banye ya mmiri agaghị akari uhie ahụ ha suru, emesia ha egwe ya na ndu ode ede nke ọma, malite ite na ire ya n’ahịa. Otu ahụ ka e si emekwa edo.

GUO:  Ichọ mma n'agba ọfụụ

Tangere na nzu bụ n’ala ka e si egwupụta ha. A na-egwe ha na ngwụ tụtụ etebe ha n’arụ. Uri dị ụzọ abụọ. Uri nke na-adị oji bụ ihe ọtụtụ mara nke ọma.  Ọ bụkwa n’osisi ka e si eweta ya. Uri nke na-adi oji bụ mkpụrụ osisi ma nke ọzọ bụ na mkpọrọgwụ osisi ka esi eweta ya. Ihe magburu onwe ya na ihe ịchọ mma oge ochie bụ na ọdịghị nke na emeru arụ na ụdị ọbụla.

Ma ugbua, ụfọdụ ihe ịchọ mma enwere na enye nsogbu n’arụ malite na ude a na-ete na iru na arụ, nke ana akwanye n’anya, nke ana etinye na mbọ ụkwụ na mbọ aka, rukwarị na nke ụmụnwaanyị ji agbati ntutu isi ha.

Ihe ndị a nile nwere ọghọm dị na ya. Ebum n’obi e ji ede ihe a abụghị na agba ochie ka mma. Ọ bụ ka onye ọbụla n’achọ mma ugbua  kpachara anya, mara nke a gaghị enye ya nsogbu n’arụ ma ọbụ n’iru.

 

 

 

 

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here