
UDO na ọñụ biri ọma n’ụlọ ọlụ Anambra Newspaper and Printing Corporation (ANPC) bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ ‘National Light’, Ka Ọ Dị Taa na ‘SportsLight Xtra’ ụbọchị Tuzdee.
Ha mere mmemme iji weta ezi mmekọrịta na ihụnanya zuru oke (re-union) n’etiti ndị ọlụ na onyeisi, tinyekwara ndị lagoro ezumike n’ọlọ ọlụ ahụ.
E ji ekpere ngọzị (benediction) were mee ya nke Rev. Fr Peter Andrew Ibeazor nke ‘St Thomas Aquinas Parish G.R.A Awka’ nọ n’isi ya. Onyisi (Managing Director) nke ụlọ ọlụ ahụ bụ ‘Sir’ Chuka Nnabuife kọwara na mmemme ahụ bụ maka udo; ka obi dajụọ onye ọbụla bu iwe n’obi.
Nnabuife kwuru na ụlọ ọlụ ahụ chọrọ udo zuru oke ka ọlụ wee na-aga nke ọma.
Fr Ibeazor rụtụrụ aka na ime udo dị mma makana a na-esi na mmụọ jebe ije wee pụta n’ife. Ọ kpọkuru ndị mmadụ ka ha pụta kwuo ka o si dịrị ha. O kwuru si; “onye mara ebe e mejọrọ ya, o kwuo.”
Maazi Ubani, onyeisioche otu nhazi mmemme ahụ ma bụrụkwa onye nagworo ezumike nka na Maazị Ekemezie bụ onye nọkwa ezumike nka kwuru na ndị e mejọrọ hiri nne. Ha rụtụrụ aka ụzọ dị iche iche e si wee mejọọ ha, kemgbe ọtụtụ afọ gara aga.
N’ime ihe nile, ụkọchukwu nọ n’isi emume bụ Fr Ibeazor kwupụtara afọ ojuju o nwere maka ọgbakọ ahọ. Ọ rịọrọ Chineke ka ọ gọzie ụlọ ọlụ ANPC.
Ọ gwara ha sị “mmadụ ezughị oke. Ọ bụladị Peter, onye nke e wukwasịrị ụka n’isi ya ezughị oke. Ya mere, ka anyị nagide onwe anyị nile. Ndị ọlu ngo (ndị ọlụ ogbasaghị m) chegharịanụ makana ihe gbasara otu onye gbasara mmadụ nile, gbaa mbọ ka ọ dị mma maka ihe mere isi ga-emechaa matụta ụkwụ.”
Ụkọchukwu ahụ nyekwara ndị ọlụ ndụmọdụ ka ha na-enyere onye nọ n’isi aka, ka e wee na-enwe ezi mmekọrịta. O kelere ha ma chetakwa mkpa ọ dị ịdị na-eme ụdị emume ahụ makana e ribie anụ e were azụ kwụọ ụgwọ.
Onyisi ụlọ ọlụ ANPC, ‘Sir’ Chuka Nnabuife dịka onye isi, rịọrọ mmadụ nile ndị e mejọrọ mgbahara ka udo wee chịa ma kwekwa nkwa inye ha nkwado bụ ịgba.
Ụkọchukwu gakwara n’ihu gwa ndị ọlụ ka ha gwa onwe ha eziokwu ma mata ụzọ dị iche iche ha siri mejọọ.Ọ gwara ha na ha kwesịkwara ịrịọ onyisi mgbaghara.
Oriakụ Oby Odiaka, onyeisi ngalaba mgbakọ na nwepụ (Accounts) n’aha ndị ọlụ ANPC rịọrọ onyeisi, Sir Nnabuife mgbaghara ma kwe ya nkwa ịgbanwe n’ụzọ ka mma. N’aha ndị ANPC lagoro ezumike nka, ABC Ubani rịọkwara onyisi mgbaghara. Fr Ibeazor n’aha ụka rịọkwara mmadụ nile ka ha gbaghara.
O kwuru na ha mee nke ahụ, na ọ ga-abara ha uru. O jikwa ohere ahụ kọwaa mkpa ọ dị ịkpọku Chukwu mụọ nsọ.
N’ekene mmechi, Maazị Onugha kelere ụkọchukwu na mmadụ nile maka oke mmemme ahụ. Sir Nnabuife kelekwara ụkọchukwu na mmadụ nile. Ebe nile wee bụrụ ọñụ ọñụ.
N’ikpeazu e jizi ekpere na abụ otito wee mechie ụka ngozi ahụ. Ihe pụtakarịchara ihe gụnyere ịgọzị mmiri nsọ nke ụkọchukwu fere ma hafezie Sir Nnabuife n’aka, o wee fezuo ya ụlọ ọlụ ahụ nile, ebe ndị ọlụ ji abụ na egwu wee na-eso ya n’azụ.