ỌBAAKWỤKWỌ Ọha bụ ebe a na edebe akwụkwọ ederedé ka o were dịrị ndị mmadụ nfe maka mmụta.
N’ime Ọbaakwụkwọ, a na ahazi akwụkwọ niile n’usoro n’usoro, ka o were dịrị onye ọbụna nfe ị chọpụta ụdị akwụkwọ ọ chọrọ.
Mana Ka ọ dị ugbua, Ọbaakwụkwọ abụghị ebe a n’edebe sọọsọ akwụkwọ, ọ bụkwazi ebe a na e dokwaba ihe Ọkpụ, dịka Nkechi Udeze siri kọwa.
Nkechi Udeze bụ nwa-ada na afụ maka Ọbaakwụkwọ niile dị na Steeti Anambra. Ọ gwara m sị “Otu n’ime Okè na Ọrụ dịịrị Ọbakwụkwọ niile bụ ịchekwaba omenala Igbo”
Ọọ ihe nwute na ọtụtụ Ọbaakwụkwọ e nwere ejighi asụsụ Igbo kpọrọ ihe. Ị gaa Ọbaakwụkwụ diche iche na ala anyị, Ị ga ahụ na akwụkwọ e dere na asụsụ Igbo na ndị e dere maka igbo bụ ihe a n’achọ-achọ. Ị chọta akwụkwọ Igbo n’ọbaakwụkwọ dị ka ị chọta mkpịsị-azịza n’ime ikpo ahịhịa.
Oge eruolá ndị be anyị ga aghọta na ihe kpataara e ji arụ ọbaakwụkwọ bụ ka obodo dị icheiche were chekwaba asụsụ, omenala na ọdịbendị, ọ bụghị maka ị kwanite omenala na asụsụ ndị mbà. Maka na Echi, mgbe ụmụaka chọrọ ị ma ka obodo ha siri bi ndụ mgbe gara aga, ọọ n’ ọbaakwụkwọ ka ha je a ga. Kedụ ihe ha ga ahụ maka ndị igbo mgbe ha gaara na Ọbaakwụkwọ dị n’ala Igbo, onwekwarà ihe ha ga amụta maka etu anyị siri bi ndụ, Kaọbụ sọọsọ etu ndị bekee si bi ndụ ka ha ga-adị n’agụ?
Iwu hiwere Ọbaakwụkwọ kwadorò na Ọbaakwụkwọ ga e sò n’echekwaba ihe Ọkpụtọrọ-ọkpụ.
Dịka ihe nna nna ji bi ndụ mgbe gboo. Mana Ọbaakwụkwọ ole nwere ngalaba maka ichekwaba ihe Ọkpụ? Sọọsọ Ọbaakwụkwọ Kenneth Dike nke dị na Ọka (Awka) ka m mà nwere ngalaba maka ihe ọkpụ.
O ge eruola mgbe ndị Igbo ga e neba anya n’ihe metụtara i ji Ọbaakwụkwọ Ọhà echekwaba omenala anyị. O doro onye ọ bụla anya na ndị Ụka na-etikpọsị ihe Ọkpụtọrọ-Ọkpụ dịgasị na ala Igbo mgbe ha na eme ekpere.N’otu aka ahụ, Ụfọdụ ndị Ụka na agba mbọ ka ha fụ na asụsụ Igbo nwụrụ pịị site n’ịsụ onyibo mgbe ha na-agbasa oziọma ha.
Site na agha ụfọdụ ndị Ụka na ebuso Asụsụ na Omenala Igbo, Ọ bụrụ na Ọbaakwụkwọ Ọha agbaghị mbọ chekwaba ihe ụwa jiri mara anyị, mata nụ na anyị ga anọ n’ime mmiri, ncha a baa anyị anya.
E ji m ohere a akpọ ndị niile na ahụ maka Ọbaakwụkwọ na ala igbo ka ha nye aka nwude ewu oji a tupu chi e jie. Nke a bụ Oziọma Ọdịnanị m ji were bịa ta. Cheta na Nkụ dị na mba na eghere mba nri.