September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Akụkọ ifo: Agafu ọkpa ogologo

 Ọ DỊ otu obodo nke dị n’otu mpaghara eji ọlụ ugbo wee mara. Ọ dị otu nwoke siri ike n’ọlụ ugbo nke na ịhụ ọba ji ya, ichee na ọ bụ ebe a na-asumpi egwuruegwu. Dịka a na-ekwu na ebe ezigbo ihe dị, ihe ọjọọ na-anodebe ya. O nwere ndị omekome nọ n’obodo ahụ emekpa ndị mmadụ ahụ, ha chọpụtara ebe aja nwoke ahụ siri daa.

Ndị omekome ahụ bụ Agafu ọkpa ogologo na enyi ya nwoke! Ma na-asịrị na-agafu na-ama ibe ya. Ọ dị ụzọ ha si agwarita onwe ha okwu ka onye ọ bụla ghara ịghọta ihe ha na-ekwu. Ụzọ ahụ bụ iji ọnụ gbuo ọka ma ọ bụ nke a na-akpọ mkpọrọfụfị.

Otu ụbọchị, enyi Agafu ọkpa ogologo were ọja kpọọ ya n’ụdị ha si: “Agafu ọkpa ogologo”! Agafu ọkpa ogologo azaa ya “Ee”!

Ọ sị ya: ịhụkwara ebe aja siri da?

Agafu ọkpa ogologo azaa; ka ọ dịba ka ọ dịba mgbe chi jiere!

O rue mgbe chi jiri, ha gaba ohi n’ọba ji nwoke ahụ. Agafu ọkpa ogologo bụ onye izu ohi doro anya nke ọma. Ọ bụ ya na-atụpụrụ enyi ya ji, enyi ya a na-aghọrọ. Mgbe nwoke nwe ụlọ chọpụtara na ndị ohi nọ n’ọba ji ya, ọ pụta, enyi Agafu ọkpa ogologo wara ọsọ. Nwoke ahụ wee na-aghọrọ ji Agafu ọkpa ogologo na-atụ ma Agafu ọkpa ogologo amaghị na ọ bụ onye nwe ji na-aghọrọ ya ji.

Enyi ya wee were mkpọrọfufị kpọọ ya sị: “Agafu ọkpa ogologo! ọ bughịkwa m na-aghọ gị ji. ọ kwa onye nwe ji na-aghọ gị ji. Were otuji tụkpọọ ya anya”!

Agafu ọkpa ogologo wee chọọ nnukwu ji buru ezigbo ibu tụọ ya “gbim” n’ebe nwoke ahụ nọ. Nwoke ahụ wee daa. Agafu okpa ogologo narie. Chakpii!

%d bloggers like this: