OTU nwata akwụkwọ nke mahadum ‘University of Port Harcourt’ na steeti Rivers a nwụọla n’ụzọ nke mmadụ amaghị. Nwata nwaanyị ahụ gbara afọ iri na asatọ aha ya bụ Olaitan Gbadamosi bụ onye nke mere emume nnabata (matriculation) n’ọnwa abụọ gara aga ka e butere ozu ya n’ọnụ ụlọ ya nke dị n’Omuoko Aluu n’okpuru ọchịchị Ikwerre na steeti Rivers.
Ọ bụ onye steeti Oyo ma nọrọ n’ogo nke mbụ (100 level) n’ihe ọmụmụ ‘Chemical Engineering’ na mahadum ahụ.
Ọnwụ nwata nwaanyị ahụ gbagwojuru ndị mmadụ anya n’ihi na ha amaghị ihe kpatara ya. Ebe ụfọdụ na-ekwu na o gburu onwe ya ndị ụfọdụ na-ekwu na e gburu ya egbu.
E kwuru na ọ bụ mgbe ụmụakwụkwọ ibe ya ahụghị ya n’ule nnwale abụọ ha mere ka ha ji chọrọ ya bịa n’ụlọ ya. N’ihi nke a, ka ha na ndị agbataobi ji tulee ihe a ga-eme nke mere ka e jiri mbe (ladder) wee site na window nyobaa anya n’ụlọ ya. Ha hụrụ ka ọ tọgbọ n’ala; wee gbawaa ụzọ ya hụzie ka ihe siri gbata kwụrụ.
Ha hụrụ ọgwụ ọjọọ (sniper) ka ọ tọgbọ n’akụkụ ya. Ha amaghị ihe merenụ na otu o si mee.
Otu o sila dị, e kwuru na ndị uweojii eburula ozu ya maka nnyocha.