NDỊ ọlụ oyibo mere mmemme ome n’afọ ha ụnyaahụ bu abali mbụ na ọnwa ise afọ 2019. Mmemme ndị olu a bụ nke malitere n’ala America n’afọ 1886. Tupu afọ 1886, ndị ọlụ na- enwe ọtụtụ mkpagbu n’ihu ọlụ nke na-eme na ụfọdụ ndi ọlụ na-ada n’ihu ọlụ ha nwuọ.
Ụfọdụ daa, ha abanye na nsogbu ga-eme na ha agaghị alaghachi n’ọlụ ahụ ọzọ. Ihe na-ebute nke ahụ bụ na ha adịghị ezu ike. Ndị na-achị ha adịghị enwe ọmịko n’ebe ha nọ. Mgbe ndị ọlụ malitere kwube maka afụfụ ha na-ata na awa ole ha na-alụ ọlụ dI ukwu, ndị na-achi ha malite kwa imekpa ha karia nke mere n’afọ 1884, e gburu ọtụtụ ndị ọlụ.
Nke kachasI bụ ntigbu ndị uwe ojii na ndị na-alụrụ ndị nwe ọlụ akpụ obi tigburu nwanta di afọ asato maka na o kwuru n’afụfụ ndị ọlụ karịrị. Ka nke a gasirI, ndi otu a kpọrọ ‘organised labour’ pụtara ihe lụba ọgụ maka inwere onwe nke ndị ọlụ nakwa ibeleta awa ole ha na-alụ ọlụ site n’awa iri ka ọbụrụ awa asatọ.
Gọọmenti na ndị nwe ụlọ mmepụta ngwa ahịa na kwa ngwa ọlụ di iche iche wee leba anya n’-okwụ ndị ‘organised labour’ we nye ndị ọlụ awa asato ma nye iwu ibelata afụfụ ha na afọ 1886.
Malite n’afọ 1886, ndị ọlụ ji abali mbụ na onwa ise afọ ọbụla eme icheta ndị ọlụ tufuru ndụ ha maka inwere onwe nke ndi ọlụ nakwa iñụri ọñụ na ha dị ndụ. Ndi ọlụ na mba uwa iri ịsii na isii na-esonye na mmemme ubọchị ndi a. ụfọdụ obodo na-ahazi ubọchị ahụ n’ụzọ pụrụ iche.
Ndi ọlụ kwụsịa n’ahịrị n’ahịrị, a na- enwe ndị ga-eme ihe egwuru egwu dị iche iche dịka ịgba egwu, igba ọsọ, igba bọlụ, ndi ji ego akpọrọ ndi ha hụrụ n’anya gaa ụlọ oriri dị mma.
Na steeti Anambra, ha na eme kwa nke ọma. Ọ bụghị nanị ndị ọlụ na-abia mmemme ahụ, ndị igwe, ndị a mara aha ha n’ obodo, ndị e ji okwu ha eme ihe ma nwoke ma nwanyi, ndi ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa ndị welitere isi na gọọmenti na esonyekwa na mmemme ahụ.
Ọ bụghị nanị ndịa, ndi ọlụsị dị iche iche na-abia kwa nke mere na ha na-eweputa onye na-akọwapụtara ndi ogbi ihe a na ekwu.
N’ezie, oge ahụ bụ oge gọọmenti ji eleba anya na ihe gbasara ndi ọlụ; itinyere ha ego n’ikwe ha nkwa ihe ọ ga-emere ha na afọ dị nirụ. Ndị ọlụ na-ejikwa ohere ahụ agwa gọọmenti ihe ha chọrọ ka o mere ha. Ndị ọlụ ejighị abali mbụ nke ọnwa ise egwu-egwu chaa.