NDỊ uweojii steeti Enugu anwuchikọọla ụmụnwaanyị abụọ rere nwa abalị abụọ.
Nwa ọhụrụ ahụ e rere bụ nwa nwanne otu n’ime ha, ma bụrụ nke ha rere n’ọnụego narị naịra atọ (N300,000) A nwụchịkọrọ nwaanyị ahụ n’Ovoko nke dị n’okpuru ọchịchị Igbo Eze ‘South’ na steeti ahụ.
Ọ bụ ndị ọlụ nchekwa steeti ahụ bụ ndị zọpụtara nwa ọhụrụ ahụ bụ ndị nke e resịrị ndị mgbere mmadụ ma hafee ndị kpara nkata ahụ n’aka ndị uweojii.
Otu n’ime ndị ahụ aka kpaara bụ onye ụmụgbabe Ovoko kwuputara na ọ bụ otu nwaanyị aha ya bụ Ekutosi rịọrọ ya ka o nyere ya aka ree nwa nwanne ya nwaanyị n’ihi na ha achọghị nwata ahụ n’ezinaụlọ ha.
Mana ya bụ onye a na-ebo ebubo kwuru na ọ bụ enyi ya nwaanyị ka ya nyeere aka iri nwata n’ihi na nne (nwa ahụ) dị afọ iri na atọ, n’ihi ya ọ orueghị ogo ịzụ nwa. Dịka nwaanyị sị Umugbabe si kwu, o kponyere ya bụ nwaanyị nwa ahụ ozugbo na steeti Rivers onye nke kwere nkwa ịkwụ narị naịra atọ.
Otu o sila dị, nwaanyị ahụ onye nke a nwuchikọrọ n’Ovoko duuru ụfọdụ ndị uweojii gaa na nke nwaanyị ahụ o resịrị nwa ebe a nọ zọpụta nwa ahụ.
Onye mụrụ nwa ahụ aha ya bụ Tochi bụ onye nke e nwetere n’ime ụlọ nwanne ya nwaanyị ka ọ na-agba ọbara n’ihi nsogbu o nwetere n’ịmụ nwa, e wee kpọga ya ụlọọgwụ.
Ya bụ nne nwa si Obollo Afor, n’okpuru ọchịchị Udenu na steeti ahụ bụ onye na-akwa baro (wheelbarrow) onye Amachalla n’Igbo Eze ‘North’ n’otu steeti ahụ tụbara ya ime.
E kwuru na ezinaụlọ abụọ ahụ kpebiri ire nwa ọhụrụ ahụ n’emeghị ka nna nwa ahụ mata.
Ka o si dị ugbua, ndị uweojii nke steeti Enugu ekwela nkwa iforo ntutu ha taa ịhụ na a kụsuru ndị nile aka ha dị n’ịtụ mgbere ụmụaka na steeti ahụ.