September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Ụwa ụmụnwanyị: Ụmụnwaanyị na alum di

ALUM di na nwunye bụ otu nnukwu ihe Eke kere ụwa jiri jikọta ụwa nile ọnụ na-agbanyeghị agbụrụ, okpukpe ma ọ bụ ebe onye siri bịa. Ọ bụ ọlụ dịrị nwaanyị ịhapụ ezinaụlọ nke aka ya gakwuru nwoke ka ya na ya biri, nke a na-akpọ alum di na nwunye.

Alum di na nwunye bụ oke mmemme na ihe na-eweta obi añụrị ebe ọbụla a na-eme ya. Ọ bụ nnukwu ihe na-ejikọta ezinaụlọ na ezinaụlọ, nwanne na nwanne, enyi na enyi, obodo na obodo wdg. Ọ bụ ihe a na-enwe nkwekọrịta na nkwado tupu emebe ya. Ọ bụ ezie na enwere ọtụtụ obodo ma ọ bụ agbụrụ dị iche iche na-eme nwaanyị ka a ga-asi na ha abụghị nwa mgbe ọbụla amụrụ ha, n’ihi na enwebeghị nwa nwoke n’ezinaụlọ ahụ, na-amaghị na ọ bụ nwaanyị bụ isi sekpụ ntị n’ọmụmụ na ụbara mmadụ n’ụwa taa.

Echiche Chukwu kere ụwa na mmadụ abụghị otu n’ihi na ọ bụrụ n’echiche mmadụ gaara ha ka ha siri chọọ, a ga achọpụta na ụbara ụmụnwoke ga-akarị nke ụmụnwaanyị otu ọchịchọ nwa nwoke dị n’obi onye ọ bụla. Kedụ ka ụwa a ga-adị ma ọ bụrụ na ụbara ụmụnwoke akarịa nke ụmụnwaayị? Ọ kachasi ụmụnwoke na-alụ ọtụtụ nwaanyị. Onye ka ha ga-alụ? Ọ bụ n’ihi ụmụnwaanyị ka eji nwee alum di na nwunye na-agbanyeghị akaje a na-eme ha na emo dị iche iche a na-akwa ha site n’ịgwa ha okwu dị otu a: “Di dị ụkọ”, “ụmụnwaanyị bụ awalawa tomato”, “ụmụnwaanyị bụ nsogbu,” wdg.

Ọtụtụ ụmụnwoke sịrị na ọ bụ ụmụnwaanyị bu nsogbu nile juru ụwa taa. Ma ọ bụrụ n’okwu a bụ eziokwu, kedu ihe mere ọmụmụ jiri site n’aka nwaanyị? Kedu ihe mere Eke kere ụwa jiri kee nwaanyị ma wube alụm di na nwunye? Kedu ih ejiri kwuo na nwoke chọtara nwaanyị chọtara ezigbo ihe?.

%d bloggers like this: