NA ngwụcha izuụka gara aga ka ụlọikpe ukwu nke steeti Edo mara otu onyeisi ụka, Pastor Udoka Ukachukwu na enyi ya nwaanyị, Eniobong Isonguyo ikpe ọnwụ n’ihi ogbugbu ha gburu otu onye ọlụ nọ n’ogo dị elu na ‘Nigerian National Petroleum Corporation’ (NNPC) n’afọ 2013.
Nwoke ahụ e gburu egbu bụ ‘Engineer’ Victor Gabriel Isonguyo bụ dị Eniobong. Onyeisi ụka ahụ gburu ya ma gbaa ozu ya ọkụ n’ihi na ọ tụbara nwunye ya ime. Nwoke ahụ ka e kwuru na ọ chọrọ ịmata otu nwunye ya si dị ime mgbe ya anọghị ya. Ọ bụ n’ihi nke a ka ha ji gbaa izu gbuo ya ma gbaa ozu ya ọkụ.
Ka ha gbuchara ya, onyeisi ụka ahụ kwakọrọ ihe akụ akụ na ihe enwe enwe nwoke ahụ lara mmụọ, nke gụnyere ụgbọala ya nke e nwetere otu n’aka ya tinyere nde kwuru nde naira na ọtụtụ ala na ihe ndị so ya n’azụ nke ọ hafechara ka ọ bụrụzie nke ya.
Justice G. Imadegbelo mara mmadụ abụọ ahụ ikpe ọnwụ site n’ịtụ ụdọ (death by hanging).
Eniobong, onye nke dị ime ọnwa anọ n’oge ahụ ya bụ ihe mere ka e kwru na ọ mụọla nwa n’ụlọnga Benin.