AKWA bụ ihe a na-eyi iji kpuchie ọtọ. Ọ dị ụdị akwa dị iche iche e ji ekpuchi ọtọ. Mgbe a kwusiri iyi jigida, ọ dị akwa ndị Igbo malitere yibe a kpọrọ akwaete, ma nwoke ma nwaanyị na-ama akwaete. Ndị nwoke na-awa ya awa ma ọ bụ maa ya n’ukwu ka nwaanyị.
Mpaghara ọbụla nwere aha ha na-akpọ akwaete dịka asụsụ ha siri di. Akwaete a bụ n’ala anyị ka e si nweta ihe niile e ji eme ya. Ọ dị ukwu osisi na-ami owu, osisi ahụ michaa kaa,
ọ gbawaa ewekọtachaa owu ahụ wepu mkpụrụ ya, ha wepusia ya, ha amalite ikeko ya n’osisi. Nke ahụ gasia, ha eresị ndị na- ekwe akwaete. Ndị na -ekwe ma ọ bụ akpa akwaete na- eme ụdị atọ.
Nke ụmụnwoke adịghị adị obosara ka nke ụmụnwaanyị,nke ụmụnwaanyị na-adị ụzọ abụọ; nke nnukwu na nke obere mana ụzọ atọ ahụ adighị eru obasara ma ọ bụ ogologo ka obi akwa ugbu a.
E kwesia ya, ọ na- adị ọcha, ha na- esiji ya n’ụdị dị iche iche dịka uhie, edo, oji, akwụkwọ ndụ. Ọ bụ ezie na a na-agba ọtọ, ihe ọjọọ dị ugbua adịghị nnukwu oge ahụ. Ụmụnwoke na ụmụnwaanyị na- enwe egwu Chukwu na egwu ndị mụrụ ha ya na ezi aha ejiri mara ezinaụlọ ha.