IGBO kwuru sị na onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee ọ hụ ahụ. N’ịgbasò nke a, gọọmenti steeti Anambra anwụchikọọla onye ọzọ iwu akwadòghị na-anakọkwa ụtụ n’ụzọ iwu akwadòghị n’Amaenyi dị n’okpuru ọchịchị ‘Awka South’ na steeti ahụ.
Nwa amadi ahụ gbaārā ahọ iri atọ na iteghete, onye aha ya bụ maazị Ikechukwu Ndụkwe bụ onye a nwụchikọrọ nso-nso a na mpaghara ụzọ Amaenyi, site n’aka ndị ụlọ ọrụ steeti ahụ na-ahụ maka azụmahịa, ịtụ mgbere ahịa na ikewàpụta akụnụba.
N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ dịka ọ gbachara onye ahụ a na-enyo ènyò n’awụ ma kpụgharịa ya n’isi ụlọ ọrụ oyibo steeti ahụ, bụ ogigè Jerome Udorjị dị n’Awka, kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka azụmahịa, ịtụ mgbere ahịa na ikewàpụta akụnụba, bụ Maazị Christian Madụbuko katọrọ kpamkpam, otu ụfọdụ ndị mmadụ siri kpebie ịbụ ọkụkọ ntị ike, site n’ịga n’ihu na-agbakụta iwu gọọmenti azụ, ma na-eleghàrakwa ntụziaka ya anya.
O kwuru na na-agbanyeghị ntụziaka gọọmenti steeti ahụ nyèrè ka a kwụsịgodi ịnakọ ihe ọbụla bụ ụtụ n’ụdị ọbụla na steeti ahụ, ya na ọkwa niile a màrà na nke a na na-ama bànyere nke ahụ, na ọtụtụ ndị ihe ọjọọ na-atọ ụtọ ka gara n’ihu na-anapụsị ụfọdụ ụmụ mmadụ ego ha tàrà ahụhụ wee kpaa, n’ụdị na ha na-anakọtara gọọmenti ego, bụkwa nke na-adịghịkwa eru gọọmenti ọbụla aka.
O chetazịịrị ọhaneze na ntụziaka ahụ na mmàchi ahụ ka dịkwa ìrè wee ruo n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Juunu, ọbụnadị dịka o fooro ntutu taa sị na gọọmenti ga-aga n’ihu n’ịnwụchikọ ndị dị otu ahụ ma na-akpụpụkwa ha ụlọ ikpe, ka e were usoro iwe wee jụchasịa ma nyụchaa ha anya.
Na ntụnye nke ya, kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka gburugburù, bụ maazị Mike Okonkwọ katọkwara ya bụ akparamagwa dịka nke jọgburu onwe ya n’ihi na ọ bụ ohi na ịnapụ ụmụ mmadụ ego ha tara ahụhụ kpata, ma mekwa ka a mara na gọọmenti steeti ahụ eguzobela ụlọikpe pụrụ iche ga na-elebàrá ụdị okwu ahụ anya iji hụ na ndị dara ya bụ iwu bụ ndị a ga na-ekpe ikpe ngwangwa ma na-atụbàkwa n’ụlọ mkpọrọ na-egbughị oge, ka ndị ọzọ wee mụrụ akọ.
Na nzaghachi, nwa amadi ahụ a nwụchikọrọ na ya bụ arụrụ ala, bụ maazị Ndụkwe kwùrù n’eziokwu na ya mere ya bụ ihe, ma rịọ ka a gbaghara ya, ọbụnadị dịka o kwere nkwà na ya agaghị anwakwa anwa rọọ nrọ itinyezị aka n’ụdị ihe ahụ ọzọ ma a tọhapụ ya.
Ihe e nwekọtara n’aka ya gụnyere ego karịrị puku Naịra iri na abụọ, na ụdị akwụkwọ ikike dị iche iche e rebeghị ere.