September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Nnewi South na ndị FRSC ejikọọla aka ibelata ihe mberede okporo ụzọ

 N’IJI bèlata oke ihe mberede okporo ụzọ, gọọmenti okpuru ọchịchị Nnewi South, nke steeti Anambra azọpụla ụkwụ dike ijikọ aka ọnụ, ya na ndị òtù ọrụ ala anyị na-ahụ maka ije awele na nchekwa okporo ụzọ, bụ ụlọ ọrụ ‘Federal Road Safety Corps’.

Nke a bụ nke e mere ka a mara site n’ọnụ onyeisi oche ọchịchị nchere ogè n’okpuru ọchịchị ahụ, bụ maazị Chieloka Okoye, oge ndị òtù ọrụ ahụ gara kpọtụrụ ya n’ụlọ ọrụ ya dị n’Ụkpọr, bụ isi obodo okpuru ọchịchị Nnewi South.

N’okwu ya na ya bụ ọgbakọ, maazị Okoye mere ka a mara oke mkpà ọ dị ịhụ na e na-enwe njem siriri wèrèrè n’okporo ụzọ dịgasị iche iche, ya ezi nchekwa nke ndị na-agba n’okporo ụzọ na ndị ha bù n eme njèm, bụ nke o kwuru na a pụrụ ime ka ọ dị ìrè site n’inye ndị na-akwọ ụgbọala ezi nkuzi na ọzụzụ.

Ọ kpọkuzịrị ndị òtù ọrụ ahụ ka a gaa n’ihu ịbagide na njem ịkọwaara na ịkụziri ndị na-ànyà ihe ọnyịnya ihe ha kwesiri ịma, iji wee belata ihe mberede okporo ụzọ na ihe ndị ọzọ yiri ya, ma kwekwazie nkwà inye ha nkwàdo n’ozuzu òkè n’imezùpùta nke ahụ.

Na nzaghachi, onye duru ndị òtù ahụ wee bịa ya bụ njèm, bụ oriakụ Christy Ọbasị kelere maazị Okoye maka nnabata ya nakwa ezi atụmatụ ahụ, ọbụnadị dịka o kwere nkwà ịga n’ihu n’ijikọ aka ọnụ, ya na okpuru ọchịchị ahụ, iji hụ na ya bụ ezi ebumnobi bụ nke pụtara ihè ma mịtakwa mkpụrụ a tụrụ anya. O jikwazịrị ohere ahụ kpọkuo ma dụọ ndị na-akwọ ụgbọala na ihe ọnyịnya ndị ọzọ, ka ha zèéré ịgba oke ọsọ, ibū oke ibū, ịñụ mmanya na-aba n’anya tupu ha akwọba ụgbọala nakwa ihe ndị ọzọ dị iche iche na-ewèta ọka n’ọnụ ọgụgụ ihe mberede okporo ụzọ nakwa ọnwụ ike na-esòchi ya azụ.

%d bloggers like this: