Dịka ndị uwe ojii steeti Anambra jidekwara ọtụtụ ndị ohi na ndị otu nzuzo
E KWURU sị na ịkpọ ngwere emeghị ihe o jiri bụrụ ịkpọ ngwere, ụmụaka ewere ya mere anụ n’ọkọchị na n’udummiri. N’ihi nke a ka ọchịchị steeti Anambra ji ebu agha esepughị aka, megide mpụ na arụrụala na steeti ahụ.
Ka ọ dị taa, ndị uwe oji, n’okpuru atụmatụ ọrụ ‘Puff Adder’, bụ òtù e guzobere nso-nso a n’Ọnịtsha site n’aka kọmishọna ndị uwe ojii na steeti Anambra, bụ maazị Mustapha Dandaura anwụchikọọla ụmụokorobịa abụọ maka ịpụnara mmadụ àkpà na ihe ndị ọzọ n’ike na mpaghara Upper Iweka.
Nke a bụ nke e mere ka a mara site n’ozi a kpụrụ nso-nso a, ma bụrụkwa nke onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ maazị Haruna Mọhammed bìnyèrè aka na ya. Maazị Mọhammed, site n’ozi ahụ, mèrè ka a mara na mmadụ abụọ ahụ, bụ maazị Ugwuanyị Ifeanyị (gbara ahọ iri abụọ na ótù) na maazị Sọpụlụ Ugwoma (gbara ahọ iri abụọ na abụọ) bụcha ndị Nsụkka nke steeti Enugu, ma sòkwa na ndị ‘òrèrè ntị goro isi ike’ ahụ na-eyi ụmụ mmadụ egwù na mpaghara Upper Iweka nakwa mpaghara okporo ụzọ awara awara ahụ siri Ọnịtsha gaa Owerri kemgbe ọtụtụ ahọ.
Ọ gara n’ihu mee ka a mara na ihe e nwèkọtara n’aka ndị ahụ gụnyèrè ótù nsụnsụ egbe a rụrụ arụ, ma sịkwazie na a na-enyocha ma na-elebàra ya bụ okwu anya nke ọma ugbua, nke mgbe e mechaara ya, a kpụpụ ndị ahụ ụlọikpe, ebe a ga-eji usoro iwu wee gbapee ha ntị.
Dịka ya bụ ozi siri kọwaa, ndị ahụ bụ ndị a nwụchikọrọ site na njikọ aka ndị ọrụ nchekwa ime obodo nakwa ndị ọrụ pụrụ iche na-ebe agha megide aka ntụtụ, bụ ndị ọrụ ‘Special Anti Robbery Squad’ (SARS).
N’okwu dịkwa ka ibe ya, ndị uwe ojii steeti ahụ anwụchiela ndị ohi atọ na ọtụtụ ndị ọzọ a na-enyo na ha bụ ndị ohi na ndị otu nzuzo site n’ebe dị iche iche na steeti ahụ.
Nke a bụ nke e mere ka ụwa mara site n’ozi ọzọ a kụpụrụ site n’aka ndị uwe ojii ahụ, bụ nke maazị Mọhammed bìnyèrè aka na ya.
O kwuru na ndị ohi mmadụ atọ ahụ bụ ndị a nwụchikọrọ maka ijide otu nwaanyị aha ya bụ oriakụ Mercy Anekwe n’ime Keke Napep, na mpaghara okporo ụzọ Limca, dị na Nkpọr, n’okpuru ọchịchị Idemili North, ma pụnara ya àkpà ya n’ike, bụkwa nke ihe dị n’ime ya gụnyere: ego dị puku Naịra iri na ise (N15,000); ekwentị ‘Camon Xpro’,
nke ọnụ ego ya ruru puku Naịra iri asaa na ise (N75,000); ekwentị ‘TECNO 661’, nke ọnụ ego ya rùrù puku Naịra asaa na narị asatọ (N7,800), na akụrụngwa e ji ewulite ikike ekwentị, bụ ‘power bank’, nke ọnụ ego ya rùrù puku Naịra atọ na narị ise (N3,500).
Ya bụ ozi mekwara ka a mara na, site na mwakpò ndị ọrụ ‘Special Anti Cult Unit’ (SPACS) mere nso-nso a n’ebe ndị omekoome na-ezogasị n’ebe dị iche iche na steeti ahụ, na a nwụchikọrọ mmadụ iri na asatọ a na-enyo ènyò na ha bụ ndị otu nzuzo na mpaghara okporo ụzọ Ihiala/Ọkịja; jide mmadụ isii na mpaghara Ekwulọbịa;
mmadụ iri na ise na mpaghara okporo ụzọ Nteje/Awkụzụ, mmadụ ise na Nkpọr, mmadụ iri na otù n’Ifite Awka, jide mmadụ iri na asatọ na mpaghara okporo ụzọ Enugwu-Ukwu/Nimo, ma nwụchikọzie mmadụ iri abụọ na abụọ na mpaghara okporo ụzọ Oko/Nanka.
N’ịga n’ihu, ozi ahụ kọwara na n’ime mmadụ iri iteghete na ise ahụ e jidere, bụ ndị a na-enyo ènyò na ha bụ dị otu nzozo, a tọhapụla mmadụ iri atọ na abụọ dịka ndị aka ha dị ọcha, kpụpụ mmadụ iri abụọ na asatọ ụlọ ikpe, debe mmadụ iri n’okpuru nnyocha ndị uwe ojii n’ihi na ha erubeghị ije nga, ebe a ka na-enyòcha mmadụ iri abụọ na ise ndị ọzọ.