DỊKA a sị na ọ na-abụ onye sọnyụọ ọkụ ya, ọ nọrọ n’ìsì, a kọwaala mkpà ọ dị ma kpọọ òkù ka a kwalite ọnatarachi, njirimara na omenala ndị Igbo iji hụ na ọ nwụnyụghị anya.
Onye ji ọkwa dịka onyeisi ọba akwụkwọ steeti Anambra, bụ nke a maara dịka ọba akwụkwọ Ọkammụta Kenneth Dike dị n’Awka, bụ Dọkịta Nkechi Udeze kpọrọ òkù a dịka ha merùbèrè mmemme ncheta ụbọchị ọnatarachi Afrịka na mba ụwa, nke afọ 2019.
Dịka o siri kwuo, o kwesiri ịbụ mmasị na ọlụ dịịrị onye ọbụla ichekwaba na ịkwàlìtè njirimara, ọnatarachi na omenala agbụrụ ya, n’ihi otu ụfọdụ omenala na ọnatarachi ndị obodo dị iche iche si anwụsịzị ugbua bụ nke na-agụ ákwá ma na-agbakwa anyammiri.
Dịka ọ na-akọwa na ọ bụ òtù ‘United Nations Educational, Scientific and Cultural Organization’ (UNESCO) hibèrè oke ụbọchị ahụ ka ọ ná-adị n’abalị ise nke ọnwa ise n’afọ ọbụla; ọ gara n’ihu kpọkuo ndị nne na nna, ndị nkụzi, na ndị Igbo niile n’izugbe ka onye ọbụla nye aka ma tụnye ụtụ nke ya n’ụzọ ọbụla o nwere ike n’ezi mbọ ahụ a na-agba iji chekwaba ma kwàlite njirimara na omenala ndị Igbo, ọ kachasị asụsụ Igbo, site n’ịkụziri na inyefè ha n’aka ụmụ na-eto eto, iji hụ na ọ nwụnyụghị anya ma ọ bụ fùó, dịka ndị òtù UNESCO buru n’amụma n’afọ 2012.
O tòkwàzịrị aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Obianọ, ụlọ mbipụta akwụkwọ akụkọ ‘Ka Ọ Dị Taa’ na ‘National Light’, na ụlọ mgbasa ozi Anambra Broadcasting Service, maka mbọ esepùghị aka ha gbàgòrò n’ịkwàlite asụsụ na omenala Igbo.
Na mbụ n’okwu mmàlite ya, onyeisi oche na mmemme ahụ, maazị Dike Ndụlue, onye kwara àrịrị bànyere ajọ ọnọdụ asụsụ Igbo nọzị na ya ugbua, mere ka a mara na ndị Afrịka adịghị agbacha mbọ otu o kwèsiri iji mee ka omenala na asụsụ gazuo ma ọ bụ nọrọ n’ogoogo mba ụwa, dịka ndị ọcha si eme.
N’akụkụ nke ya, onyeisi ngalaba nhàzi n’ụlọ ọlụ steeti ahụ na-ahụ maka mgbasa ozi na ịkọwara ọhanaeze ihe ha kwèsìrì ịma, bụ Oriakụ Uju Ụzọr bunyere ọba akwụkwọ Ọkammụta Kenneth Dike ụkpa ekele maka isonye n’imerùbe ya bụ oke ụbọchị na imerube mmemme ncheta ụbọchị ndị ọzọ dị iche iche a na-eme n’ala anyị na n’ogoogo mba ụwa, bụ nke ọ kwurù na o nyela ma gaa n’ihu na-enye aka n’ụzọ pụtara ìhè n’ịkwalite ezi akparamagwa na ọnatarachi ndị Igbo.
Na ntụnye ya, onye chọpụtara òtù ‘Save Our Indigenous Language’ (SOIL) bụ òtù na-agba mbọ ịkwàlite asụsụ ọdịnala, ma bụrụkwa onye na-achịkọba ihe mmemme Oziọma Ọdịnanị n’ụlọ mgbasa ozi ‘Anambra Broadcast Service’,
bụ Maazị Chukwu-budike Ụgbaja kọpụtara ụzọ dị iche iche asụsụ Igbo sigòrò nyere ya onwe ya aka ịbụ onye a maara aha ya n’obodo, ma kpọkuo ndị ntorobịa na ụmụakwụkwọ ka ha na-enwe mmasị n’asụsụ Igbo werekwa ya kpọrọ ihe n’ihi na ọtụtụ òhèrè dịịrị onye ọbụla maara ede ma na-asụ asụsụ Igbo ugbua.
Mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ogìgè ọba akwụkwọ ọkammụta Kenneth Dike dị n’Awka, ma bụrụkwa nke a nọ na ya wee mee ọtụtụ ihe ngosi ma gbakwa egwu ọdịnala dị iche iche site n’aka ụmụakwụkwọ na ndị ọlụ ọba akwụkwọ Ọkammụta Kenneth Dike; Maa Mbèm, tụọ nchọ, gosi ma kọwasịa ihe arụmarụ, akụrụngwa, na otu e si eme ihe dị iche iche e jiri mara ndị Igbo, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ.