September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Uru dị n’ọgbatumtum a machiri

ỌGBATUMTUM bụ otu n’ime ihe e ji eme njem ka ọ dị ngwa. Ebum n’obi e jiri mebe ọgbatumtum bụ ka ọ na-enye aka aba ebe ụgbọala enweghị ike ịba mana ndị ntorobịa ụfọdụ na-achọghị inyere onwe ha aka weere ya mere ihe iji mekpa ndị mmadụ ahụ. Kemgbe e mechiri ọgbatumtum ịgba n’ụfọdụ obodo dị n’Anambra, ọtụtụ ihe mberede okporo ụzọ beletara.

Mmechi e mechiri ọgbatumtum ịgba n’Awka na Onitsha nakwa ebe ndị ọzọ beletara ohi bụ nke ndị omekome na-ejibe ọgbatumtum ezu. N’ihi ọgbatumtum e mechiri, ụmụ ikorobịa ụfọdụ amaghị ihe ha na-alụ bụ nke na ejupụta mpaghara ụfọdụ n’Awka esigwo n’Awka puọ mana ndị nke maara ihe ha na-eme zụtara keke ozigbo akwụsiri ọgbatumtum, ebe  ụfọdụ n’ime ha zụtara obere ụgbọ ala akpọrọ ‘mini bus’.

Ihe ọzọ dị oke mkpa a ga-amara maka ọgbatumtum gọọmenti mechiri bụ na nke a gosiri na anya gọọmenti na ndị nọ n’ọchịchị na-eru na ihe na-eme n’obodo nakwa agwa adịghị mma dị na obodo.

N’ezie, kemgbe emechiri ọgbatumtum ịgba na okporo ụzọ awara awara Awka na Onitsha, ụmụ mmadụ adịzịghị achịkwa obi n’aka nke ukwu ma ha họọ ịgbafe okporo ụzọ n’ihi na ọ bụ nani ụgbọala ka ha na- ezere.

Ihe na-eweta ihe mberede ọgbatumtum abụghị na ọ na-egbu mmadụ, kama ọ bụ n’ihi na ọtụtụ ndị na-anya ya adịghị amụ ka e si anya ya amụ. Ụfọdụ n’eburu ụzọ ga ñụọ mmanya na-aba n’anya ma ọ bụ see ihe osise, ha mesie nkea, isi ha agaghị achịkọtazi ihe nke ọma.

Ma ugbua, n’ihi ezi echiche nke aka n’achị steeti Anambra, emegwo ka ụfọdụ ndị aka agba aka nwa, di, nwunye, nwanne, nne, nna na ezi enyi bụrụ ndị ha na ha nọ na ndụ nakwa ahụ ike taa.

N’ihi nke a, otu nwaamdị aha ya bụ John Udekwe, n’obere okwu ọ tụnyere maka otu o si hụta mmechi e mechiri ọgbatumtum, sịrị na ya enweghị ọtụtụ okwu ma ekene diri Chukwu maka itinye n’obi gọvanọ anyị nakwa ebe nile emechiri ọgbatumtum ịgba na ụfọdụ okporo ụzọ maka na ha zọpụtara ọtụtụ ndụ dịka ọ dị ugbua.

%d bloggers like this: