September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

A dụọla ndị bi n’Awka ka ha kpachara anya otu ha si atufu àtịtị

DỊKA a sị na ọ na-adị aka mma ịmara mmadụ ọkwà mmiri tupu òzùzò ya, a kpọkuola ma dụọ ndị bi n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra ka ha kpachara anya ma hiekwa asaa n’anya bànyere otu ha sì ejikwa na otu ha si ekpofu àtịtị, bụ ahịhịa na únyí n’ebe na n’ụzọ ekwesighị ekwesi.

Ya bụ ọkwà na ịdọ aka na ntị dị oke mkpà bụ nke e mere ka ụwà mara site n’ọnụ onyeisi ụlọ ọrụ na-ahụ maka imepe na ime ya bụ Awka bụ isi òbòdò ka ọ bụrụ eji ama àtụ, bụ ụlọ ọrụ “Awka Capital Territory Development Authority”, Maazị Emeka Okwuosa, site n’ozi ọ kụpụrụ nso-nso n’Awka.

Ọ katọrọ kpamkpam ma gbarụọ ihu bànyere otu ụfọdụ mmadụ siri bụrụ ndị ọma ụma ada iwu, site n’ileghàrà anya n’ebe dị iche iche gọọmenti wepùtara maka ikpofù ahịhịa, ma na-ekposazị ya n’ebe na-ekwesighị ekwesi ma ọ bụ wèré ya na-asụchisi ọwà mmiri.

O chetaara ndị ahụ ezi njikere ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ dị iwulite ịma mma nke steeti ahụ na gbùrùgbúrù ya, bụ nke dịkwa n’aka ụlọ ọrụ ahụ ime ka ọ pụta ìhè, ma kwukwazie na ya bụ ụlọ ọrụ agaghị anabata ihe ọbụla ga-eweta ịgbaghàchi aka elekere azụ nye imezúputa ya bụ ebumnobi.

N’ihi nke a, maka adịghị ama ama O gwàrà O, Maazị Okwuosa gwàzịrị ndị na-eme ihe dị otu ahụ ka ha sepu aka na ya, ma dụkwa onye ọbụla na steeti ahụ, ọ kachasị ndị na-azụ ahịa na ndị na-eme ihe ọzọ dị iche iche, ka ha gbaa mbọ hụ na ha na-edebe ògìgè ha ọcha otu o kwesiri, ọbụnadị dịka o mere ka a mara na onye ọbụla e jidere na-etinye aka n’imebì ma ọ bụ imetọ ịma mma na gbùrùgbúrù nke steeti ahụ ka a ga-akpụpụ ụlọ ikpe, ma were usoro iwu sụọ ya akwụ.

%d bloggers like this: