OKE ọñụ dara nnọọ na steeti Anambra nso-nso a, dịka gọọmenti ya bụ steeti kụziiri ụmụnwaanyị di ha nwụrụ anwụ ọrụ aka dị iche iche, ma nyekwa ha nkwàdo zuru òkè iji wee màlite ihe ha mụtara.
Ya bụ ọzụzụ, nke ụmụnwaanyị dị iri iteghete enweghị ka ọ hà há sònyèrè na ya bụ nke a haziri site n’aka ụlọ ọrụ steeti ahụ na-ahụ maka ọdịmma na ihe metụtara ụmụntakịrị na ndị nne, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n’ogige ọkammụta “Dora Akunyili Women Development Centre”, dị n’Awka, bụ isi obodo steeti ahụ.
N’okwu mmalite ya n’ịgbape ya bụ atụmatụ, nwunye aka na-achị steeti ahụ, bụ Oriakụ Ebelechukwu Obiano, nke onye nọchitere anya ya bụ kọmishọna na-ahụ maka ọdịmma na ihe metụtara ụmụntakịrị na ndị nne, bụ Oriakụ Ndidi Mezue mere ka a mara njikere nke ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ dị n’ịga n’ihu ịkwadò ụmụnwaanyị na ime ka ha na-esonyesi ike n’ihe dị iche iche a na-eme.
O tòrò ha maka ọnụnụ ọkụ n’obi ha nwèrè isonye na ya bụ atụmatụ, dụọ ha ka ha ghara ikwe ka ọnọdụ ha na-ahụta onwe ha na ya ugbua dubànye ha n’itinye aka n’ajọ ihe, ọbụnadị dịka o kwenwòrò ha nkwà na a ga na-emezị ka ha soro na ndị a ga na-enye nkwàdo n’okpuru ọmarịcha atụmatụ ndị ọzọ ka na-abịa n’ihu na ya bụ steeti.
Na ntụnye nke ya, ode akwụkwọ ọkpụtọrọkpụ n’ụlọ ọrụ ahụ na-ahụ maka ọdịmma na ihe metụtara ụmụntakịrị na ndị nne na steeti ahụ, bụ Oriakụ Azụka Ọfọmata, nke ọ bụ onye nhàzi ngalaba ihe metụtara ụmụnwaanyị, bụ Oriakụ Hope Ekesiobi nọchitere anya ya, chetààrà ụmụnwaanyị ahụ na ebumnobi ọzụzụ ahụ bụ iji kwàlite ọnọdụ obibi ndụ ha na nke ezinaụlọ ha; ma kpọkuzie ha ka ha were ihe ha mụtara n’ebe ahụ kpọrọ ihe ma tinyekwa ha n’ọrụ nke ọma, iji wee mezùpùta ma mekwa ka ezi ebumnobi ahụ pụta ìhè.
N’okwu ha n’otu n’otu dịka ha na-ekwupùta obi ụtọ ha bànyere ọzụzụ na nkwàdo ahụ, ụfọdụ n’ime ụmụnwaanyị ahụ, nke gụnyere Oriakụ Nkọlị Nwankwọ na Oriakụ Ogechukwu Ekwegbalụ bunyere Oriakụ Obianọ, Oriakụ Mezue nakwa ọchịchị steeti ahụ, nke Gọvanọ Willie Obianọ nọ n’isi ya ụkpa ekele maka ohere ọma na nkwàdo ahụ, ọbụnadị dịka ka ha gọọrọ ha ọfọ ogologo ndụ, ọganihu na ahụ isi ike.
Ụmụnwaanyị ahụ bụ ndị a kpọtara site n’ọgbọ nta nkwado sineeti atọ e nwere na steeti Anambra, ma bụrụkwa ndị a kụziiri otu e si emepùta ụdị ihe ọtịta na oghighe dị iche iche, ma nyekwa ha ego nkwàdo, nke mezịrị onye ọbụla n’ime ha jìrì wèré ihu ọchị laba be ya.