IGBO kwùrù sị na ọ na-abụ a gbaghị ụzọ owerì mgba, ọ naghị echi, ma sịkwazie na onye a na-agwọ ibì ọ na-eto afọ, ị mara na o nwere ihe ọ tọgbọrọ n’ajọ ọfịa.
Ọ bụ n’ịgbasò nke a, ka gọọmenti steeti Anambra siri nwụchikọọ otu onye ọzọ iwu akwadòghị na-anakọkwa ụtụ n’ụzọ iwu akwadoghị na steeti ahụ.
Nwa amadi oji ọkpa elì ozu ahụ ka a nwụchikọrọ na mpaghara Oye Agụ dị n’Abagana, n’okpuru ọchịchị Njikọka, site n’aka ndị òtù na-etinye amụma iwu bànyere ụtụ n’ọrụ na steeti ahụ, ma bụrụkwa onye e kwùrù na o ji usòrò ire akwụkwọ ikike wee na-anapụsị ụmụ mmadụ ego ha tara ahụhụ wee kpata.
Dịka ọ na-akpụgharị ya bụ nwaokorobịa n’isi ụlọ ọrụ oyibo steeti ahụ dị n’ogìgè Jerome Udọrjị n’Awka, kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka azụmahịa, ịtụ mgbere ahịa na nkewàpụta akụnụba, bụ Maazị Christian Madụbuko gbarụrụ ihu bànyere ya bụ ihe jọgburu onwe ya, bụ nke ọ sị na ndị mmadụ kachiri ntị gaa n’ihu na-eme ya, na-agbanyeghị ọkwa niile gọọmenti mara n’ebe dị iche iche na aka a dọrọ ha na ntị.
O kwuru na ha agaghị ada mbà n’ịchụgharị na ijide ndị ahụ bụ ajọ nkịta ji isi anya ọkụ na steeti ahụ, nakwa ịkpụpụ ha ụlọ ikpe ebe a ga-anọ wee yọchasịa ha, ka ndị ọzọ na-etinye aka n’ihe dị otu ahụ ma ọ bụ na-ada iwu gọọmeenti n’ụzọ ọbụla wee mụrụ akọ.
N’okwu nke ya, onyeisi ótù n’ime òtù na-ahụ maka itinye amụma iwu n’ọrụ na steeti ahụ, bụ Maazị Nathan Obikwelụ dụrụ ndị na-enupùrú iwu gọọmenti isi na ntụziaka ahụ o nyèrè ka a kwụsịgodi ihe ọbụla bụ ịnakọ ụtụ na steeti ahụ ugbua ka ha sepù aka enwe n’ofe, tupuu ọ ghọọ aka mmadụ, ọbụnadị dịka o chetaara ha na òtù ọrụ ha agaghị ada mbà n’ịwakpò na ịnwụchikọ ndị dị òtù ahụ, nakwa ịchụ mpụ na arụrụ ala ọsọ kpamkpam na steeti ahụ.
Ọ dụzịrị ndị na-akwọ ụgbọala, ndị na-azụ ahịa na ndị isi ọdụ ahịa dị iche iche na steeti ahụ ka ha ghàra igbu ogè iwètà mkpesa ozigbo, site n’ịkpọtụrụ akara ekwentị a: ‘08037835358’ oge ọbụla ha hụrụ onye adịgboloja na-anakọ ụtụ n’ụzọ iwu akwadòghị n’ebe ha na-azụ ahịa ma ọ bụ n’okporo ụzọ ọbla na steeti ahụ.
N’ajụjụ ọnụ a gbàrà ya, onye fọnfọju àkpà ahụ gbárá afọ iri atọ na anọ ma bụrụkwa onye sitere Agwụ dị na steeti Enugu, kọwàrà onwe ya dịka Maazị Udefi, kwuo hoohaa na ya mèrè ihe dị otu ahụ, ma rịọkwazie arịrịọ ka a gbaghàra ya, na ya agaghị emezị ya ọzọ ma a tọhàpụ ya.
Ihe e nwèkọtara n’aka ya gụnyèrè ego dị puku naịra iri na ótù, narị naịra ise na naịra iri abụọ, tinyere akwụkwọ ikike dị iche iche ọ na-erei ndị na-akwọ ụgbọala.