September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Ndị dịbịa obidola mepebe ụlọ ụka?

ỌTỤTỤ ụka dị iche iche juputara n’elu ụwa taa. Onye ọbụla chọrọ ibido ụlọụka nke ya. Ịbata n’otu obere obodo, ụlọụka adị iri n’ọnụọgụ, okporoụzọ obodo atụrụ (township) niile ụlọụka aka nri, aka ekpe. N’ihi gịnị? Onye ọbụla chọrọ inwe ụlọụka nke ya. Ị jụọ ya, ọ si na ya nwere ọkpụkpọ oku site n’aka Chineke.

Ihe ndị a nile bụ oke ọchịchọ n’ihi na ọbụghị iwu na onye ọbụla nwere ọkpụkpọ oku ga-emeghe ụlọụka nke ya makana ọ bụ otu akwụkwọnsọ ka e nwere, ọdịghị abụọ. Otu Chukwu dị nke kere mmadụ niile.

Kemgbe ụka ọgbara ọhụrụ batara ka ihe ọjọọ ji malite mụbawa karịa ka ọ dị na mbụ. Okwu asị, wayo, ntọrị, akwamiko, igbu ọchụ, w.d.g bụzị ụkwa a chị n’aka.

Ọtụtụ ndị isi ụka sị na Chineke kpọrọ ha oku bụ ekwensu kpọrọ ha oku ahụ, ha jirizie Chineke na-etigharị ndị mmadụ anya.

Ọ bụ eziokwu na ihe ọjọọ dị kemgbe e kere ụwa mana ọtụtụ ụka ọgbara ọhụrụ na-ewepụtazi atụmatụ abụghị ntọala ndị otu Kristi. Ha na-eji ihe doro ewu na ọkụkọ anya na ọ bụ ihe ọjọọ wee na-alụ ọlụ.

Otu onyeisiụka kwuru na ya ji akwamiko achụ ajọ mmụọ. Kedụzị nke bụ iji ihe ọjọọ alụ ọlụ? Ewu na ọkụkọ mara na nke ahụ adabaghị. Ka a na-ekwu, onye nke ọzọ jiri nsusu ọnụ na-agwọ ọrịa. Tufiakwa! Ihe dị mwute n’ihe ndị a niile bụ na ọ bụ ụmụnwaanyị ka ha ji kwara ngwa ọlụ, jirizie ha na-eme yeye.

Kedụ ka onye kpọrọ onwe ya onyeisiụka ga-esi kpọrọ nwaagbọghọ ya na ya ebiri, na-agbaghị akwụkwọ, na-amụ ụmụ? Kedụzi ụkpụrụ ọ na-atọrọ ndị na-eso ụzọ ya.

N’otu ụka ọgbara ọhụrụ ka a nụrụ na ha na-agba ọtọ n’ime ụlọụka ha,site n’onyeisiụka ha ruo n’onye ikpeazu. Ha kakata ụka, ụmụnwoke akpọrọba nwaanyị dị ha mma. Nke a pụtara na onye ọbụla nwere ikike ikpọrọ onye na-abụghị nwunye ya laa.

Ihe ọzọ wee bụrụ ihe gbasara otu ụzọ n’ụzọ iri. Ọtụtụ ụka ọgbara ọhụrụ na-amanye ndị ụka ị weta ya, mana ajụjụ bụzị ma ha ojikwa ego ahụ eme ihe ha kwesịrị iji ya eme. Otu ụzọ n’ụzọ iri abụghị nke onyeisiụka sọọsọ ya. Ego ahụ bụ ego e kwesịrị iji na-alụ ọlụ n’ụlọụka site n’inyere ndị ogbenye aka, mana taa, ndị isiụka dị iche iche na-amanyezi ndị ụka ha ịkwụ ya ma na-agwakwa ha na onye akwụghị ya agaghị aga eluigwe.

Ha jizi otu ụzọ n’ụzọ iri ụmụ ogbenye wee na-egozi ụgbọala dị iche iche, ebe ọtụtụ na-ego ụgbọelu, na-agba ala, na-alụ ụlọ. Ọtụtụ n’ime ha jikwa ego ndị ahụ alụ ụlọakwụkwọ nke ogbenye enweghị ike ịgụ akwụkwọ na ya n’ihi na ụgwọakwụkwọ ha na-adị elu karịa.

Otu nwaanyị ajadu gakwuru onyeisiụka ya rịọ ya ka o kpere ya ekpere ka ihe wee dịrị ya mma, nwoke ahụ wee sị ajadu nwaanyị ahụ na ọ ga-eji ụgbọala di ya wee kụọrọ Chineke mkpụrụ. Nwaanyị ahụ n’egbughị oge mere ihe a gwara ya mee. N’ikpeazụ, onyeisiụka ahụ mechara nyaba ụgbọala ahụ nke mere ka nwaanyị ajadu ahụ were iwe kpọọrọ ya ndị uweojii.

Oriaku Okeke, n’okwu ya kwuru na ọ bụ agụụ kpatara e ji nwee ọtụtụ ụka dị iche iche. Ọ sị na ha na-emepe ụka iji nweta ihe oriri sizie ụzọ dị otu ahụ na-emezi mpụ dị iche iche. Ọ rịọrọ gọọmenti ka ọ lebaa anya mara ihe e mere ya n’ihi na ọ na-ebutezi nsogbu aghara aghara.

Maazị Edi Okafor rụtụrụ aka na oke ọchịchọ dị ụfọdụ mmadụ n’ahụ na-eme ka ha mepee ụka nke ha. O kwuru na n’ihi oke ọchịchọ ahụ, ihe ga na-agụ ha agụụ mgbe niile bụ ihe ga-abata n’ime akpa ha; n’ụzọ dị otu ahụ ihe dị ha mma ha a na-eme n’ihi na ha ebughị Chineke n’uche.

N’akụkụ nke ya, Maazị Odili kwuru na ọ bụ ọtụtụ ndị dibịa na-emepezi ụka ugbu a n’ihi na ndị mmadụ anaghị atụnyekarịziri ha. Ndị dibịa wee batazie n’ụka na-eme ihe ha na-eme n’aha ụka mana eziokwu, ọ bụ ekwensu ka ha na-ejere ozi.

%d bloggers like this: