IGBO kwuru sị na a naghị aka àkà eje nka agwọ, kama na ọ bụ agwọ pụta, a chụba.
O wee bụrụ otu ahụ ka ndị uwe ojii na steeti Anambra (n’okpuru atụmatụ Puff Adder) siri wee nwụchikọọ ụfọdụ ndị ọzọ a na-enyo enyò na ha bụ ndị oji ụgbọala ezu ohi (a maara dịka ‘one chance’) na ndị na-apụnara mmadụ ihe n’ike na mpaghara Upper Iweka dị n’Ọnịtsha na steeti ahụ.
Nke a bụ nke a gbaara ụwa n’anwụ site n’ozi a kụpụrụ nso-nso a n’aha onyeisi ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ Maazị Mustapha Dandaura, ma bụrụkwa nke onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uwe ojii na ya bụ steeti, bụ Maazị Harụna Mọhammed bìnyere aka na ya.
Dịka ya bụ ozi siri kọọ, ndị ahụ e jidere so na ndị na-eyí ụmụ mmadụ égwù na mpaghara ebe dị iche iche n’Ọnịtsha, ọ kachasị na mpaghara Upper Iweka na mpaghara ụzọ awara awara ahụ siri Ọnịtsha gaa Asaba; ma bụrụkwa ndị a chọpụtara, site na nnyòcha mmalite e mèrè, na o teelarị ha jiri wèrè ụgbọala (e ji ebu ndị njèm) akara ya bụ XD 364 AGL, bụ nke na-acha ọcha ma na-achakwa edo èdò wee zube ohi.
Ozi ahụ kwuru na ndị oji anya ọbara achụ ego ahụ nke gụnyere Chiemezie Udoye, sitere Ụmụọmakụ nke steeti Anambra, Chinenye Okonkwọ sitere Awọmamma nke steeti Imo, Friday Nweze sitere Nnenwe nke steeti Enugu na Chijioke Ọfọrkalụ nke sitere Ihediọma Arọchukwu nke steeti Abịa, pụnaara ụmụnwaanyị abụọ ekwe ntị ha na ihe ndị ọzọ ha nwere, tupuu e wee nwụchikọọ ha. Ọ sịkwazị na ha ka na-eme nnyòcha bànyere nke ahụ, nke mgbe e mechaara ya, a kpụpụ ha ụlọ ikpe, bụ ebe a ga-eji usoro iwu wee gwọọ ha ji mmanụ.
Ya bụ ozi gakwara ihu kwuo na, site na mwakpò ndị òtù ‘Puff Adder’ na ndị òtù ọrụ nchekwa pụrụ iche na-ebu agha megide òtù nzuzo, bụ ‘Special Anti Cult’ mèrè n’ọdịnso a, na ha nwụchikọrọ mmadụ iri asaa na ise a na-enyo ènyò na ha bụ ndị otu nzuzo, ndị ohi na ndị na-etinye aka n’ihe ndị ọzọ na-ebute ala adịghị mma, bụkwa ndị e jidere site na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ, nke gụnyere Obosi, Ọsụmenyi, Ọkpụnọ, Agụleri, Ọkịja, Ụmụeri, Nteje, Ịgbarịam, Ukwulu, Awka na Nando.