Ọ dị mma nwaanyị ịgwa nwoke ka ọ lụba ya?

0
585

ALỤMDI na nwunye so n’otu omenala e nwere n’ala Igbo. Ọ bụ ụzọ Chineke wepụtara ka ụwa si na ya wee na-amụba.

Alụmdi na nwunye zuru ụwa niile ọnụ n’ihi na onweghị agbụrụ anaghị eme ya. Okpukperechi dị iche iche kwadokwara ya nke mere na ọ bụghị ihe ọhụrụ ma ọ bụ ihe a na-enyo enyo.

Ọ bụ eziokwu na ịlụ di na nwunye zuru ụwa niile ọnụ ma usoro e si alụ ya dị iche iche.

N’ala Igbo n’oge gboo, nwoke na-alụ nwaanyị mgbe o tozuru oke wee ruo ihe e ji nwoke eme. Ihe na-egosipụta nke a bụ na ọ ga-ebido na-akpata ihe ọ na-eri site n’ịkọ ugbo, ọlụ aka na ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ e si akpata ego na akụ na ụba.

Mgbe oge ruru, ọ bụ nwoke na ndị ezinaụlọ ya na-aga gwa ezinaụlọ nwata nwaagbọghọ ha chọrọ ịlụ na ha chọrọ ka ha na ha gọọ ọgọ. Nke a pụtara na ọ bụ nwoke na-ebu ụzọ na njem di na nwunye.

N’ụwa taa, nwoke na-agwa nwaanyị na ya chọrọ ịlụ ya, ha kpachaa, nwaanyị agwa nne na nna ya na o nwere nwoke na-ekwe ya ọnụ.

Mana ka ihe siri gbata kwụrụzie, ọ dịzị ka orimiri ọ na-eruchigha azụ n’ihi na ọtụtụ ụmụnwaanyị n’ala Igbo na-agwazi nwoke ka ọ bịa lụrụ ha.Nke a wee bute arụmarụụka n’etiti ndị mmadụ. Ụfọdụ kwuru na ọ bụghị omenala Igbo, ebe ụfọdụ kwuru na ọ dị mma ka ụmụnwaanyị zọba onwe ha n’ihi na ọtụtụ ụmụnwoke na-aghọrịzị ha.

N’ihi nke a, Ka Ọ Dị Taa gbara ụfọdụ ndị mmadụ ajụjụ ọnụ. Otu a ka o si gaa:

GUO:  Alụm di na nwunye

Oriakụ Eze, onye si Awka kwuru na onweghị ihe dị njọ ma nwaanyị gwa nwoke ka ọ lụọ ya n’ihi na dịka o si kwuo, na tupu nwaanyị ekwuo ụdị okwu dị otu ahụ, ị mata na o nwere ihe jikọtara ya na nwoke ahụ. O kwuru sị: “ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị na-eme enyi anọkata nke nwoke chọba ka ya na nwaanyị ahụ nwee mmekọ, nwaanyị ahụ nwere ike iji ohere ahụ si ya na nke ahụ agaghị ekwe omume sọọsọ ma ọ kpọrọ okwu aha site n’ịbịa mee ego n’isi ya wee lụba ya.”

Ọ gakwara n’ihu kwuo na ụzọ ọzọ nwaanyị nwere ike iji gwa nwoke ka ọ lụọ ya bụ ihe dịka nwoke dara ngana ma ọ bụ onye bụ akarogheli mmadụ bịakwute nwaanyịn’ihi na nwaanyị ahụ ji ego na ya bụ nwaanyị nwere ike ịgwa nwoke ahụ na ya agaghị eweputa ego ya tinye n’isi ya sọọsọ ma ọ bịara lụrụ ya. Ọtụtụ ụmụnwaanyị esila n’ụzọ dị otu ahụ lụọ di mana ọ bụrụ na o kwughị, nwoke ahụ narachaa ya ego, ọ laa.

Oriakụ Eze gara n’ihu kwuo sị: “ụmụnwaanyị na-azọzị onwe ha ka nwoke ghara ịghọrị ha.”

Maazị Okafor, n’akụkụ nke ya kwuru si na o zighị ezi nwaanyị ịnọkata gakwuru nwoke n’ala Igbo sị ya bịa lụba ya, n’ihi na ọ bụghị omenala Igbo

O kwuru sị na ọ bụ nwoke ka ọ dịịrị ịgwa nwaanyị na ya chọrọ ịlụ ya. Mana ọ gara n’ihu kọwaa na o nwere ka ọnọdụ ga-adị, nwaanyị echetara nwoke. Ihe dịka na nwoke na nwaanyị na-eme enyi, ọ dịkata nwaanyị nwere ike ijụ nwoke ọnọdụ ya site n’ịgwa ya ka ọ bịa mee ego n’isi ya. O kwuru na nwaanyị na-eme nke ahụ iji mata ije ya n’ebe enyi ya nwoke nọ ka ọ ghara ịkwocha aka, tiere ọkụkọ akị.

GUO:  Ihe mere ụmụnwoke ji achọzi ịlụ ụmụnwaanyị nwere aka ọrụ

Otu nwaagbọghọ kwuru na onweghị ihe dị njọ ma nwaanyị gakwuru nwoke gwa ya ka ọ lụba ya. Ọ sịrị na ya ahụla ebe nwaanyị nọkatara gakwuru otu nwoke onweghị ihe jikọtara ha abụọ wee gwa ya ka ọ lụba ya.

O kwuru na nwoke ahụ kwetere, ha lụba di na nwunye; na taa, ha amụtala ọtụtụ ụmụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here